9 Gbuonụ oge, ka o jukwa unu anya;+ nyachienụ anya unu, ka unu ghara ịhụ ụzọ.+ Ha na-eme ka ndị mmanya na-egbu,+ ma ọ bụghị mmanya ka ha ṅụrụ; ha adagharịwokwa, ma ọ bụghị n’ihi mmanya na-egbu egbu.+
17 “Teta, teta, bilie ọtọ, gị Jeruselem,+ gị onye ṅụworo iko ọnụma nke Jehova ji n’aka ya.+ Ị ṅụwo iko ahụ, bụ́ iko nke na-eme ka a na-adagharị adagharị, ị ṅụkpọwo ya.+
6 M wee jiri iwe na-azọda ndị dị iche iche n’ala. M wee mee ka ọnụma m na-egbu ha ka mmanya,+ meekwa ka ọbara nke na-agbapụta ha n’ahụ́ na-awụsa n’ala.”+
27 “Sịkwa ha, ‘Nke a bụ ihe Jehova nke ụsụụ ndị agha, bụ́ Chineke Izrel, kwuru: “Ṅụọnụ ya, ṅụbiga ya ókè, gbọọkwanụ agbọ daa n’ala ka unu ghara inwe ike ibili+ n’ihi mma agha m na-ezite n’etiti unu.”’+