23 bụ́ sọlfọ na nnu+ na ọkụ,+ nke mere na a gaghị akụ ihe n’ala ya dum, ihe agaghịkwa epulite na ya, ahịhịa ndụ agaghịkwa epu na ya, dị ka mgbe a kwaturu Sọdọm na Gọmọra,+ Adma+ na Zeboyim,+ bụ́ ndị Jehova ji iwe na ọnụma kwatuo;+
15 M ga-ala ugwu ukwu na ugwu nta n’iyi,+ m ga-emekwa ka ahịhịa ndụ niile dị na ha kpọọ nkụ. M ga-eme ka osimiri ghọọ agwaetiti, m ga-emekwa ka ọdọ mmiri ndị ahịhịa amị jupụtara takọọ.+
4 Ruo ole mgbe ka ala a ga-anọ na-akpọ nkụ,+ ruokwa ole mgbe ka ahịhịa dị n’ala dum ga-anọ na-akpọnwụ?+ E kpochapụwo anụmanụ na anụ ufe n’ihi ihe ọjọọ ndị bi na ya na-eme.+ N’ihi na ha asịwo: “Ọ dịghị ahụ ọdịnihu anyị.”
18 Lee, anụ ụlọ asụwo ude! Lee, ìgwè ehi awagharịwo ná mgbagwoju anya! N’ihi na ha enweghị ebe ịta nri.+ E mewokwa ka ọ bụrụ ìgwè atụrụ ga-eburu ikpe ọmụma.