2 Unu ga-ebibicha+ ebe niile mba ndị unu na-anapụ ala ha na-anọ efe chi ha, ya bụ, n’ugwu dị elu na n’obere ugwu dị iche iche nakwa n’okpuru osisi ọ bụla jupụtara n’akwụkwọ ndụ.+
23 Ha onwe ha kwa wee na-ewuru onwe ha ebe dị elu+ na ogidi nsọ+ na ogwe osisi dị nsọ+ n’elu ugwu ọ bụla dị elu+ nakwa n’okpuru osisi ọ bụla jupụtara n’akwụkwọ ndụ.+
7 n’ihi njehie ha na njehie ndị nna nna ha n’otu mgbe ahụ,”+ ka Jehova kwuru. “N’ihi na ha esurewo ihe nsure ọkụ n’elu ugwu ukwu, ha akọchawokwa m+ n’elu ugwu nta,+ m ga-ebu ụzọ tụọ ụgwọ ọrụ ha atụ̀ ma wụnye ya n’obi uwe ha.”+
20 “‘N’ihi na m kụrisịrị yok gị mgbe dị anya gara aga;+ m dọbisịrị agbụ e kere gị. Ma ị sịrị: “Agaghị m ejere gị ozi,” n’ihi na ọ bụ n’ugwu ọ bụla dị elu nakwa n’okpuru osisi ọ bụla jupụtara n’akwụkwọ ndụ+ ka ị na-edina jaghee ụkwụ+ gị wee na-agba akwụna.+