3 Ụmụ Izrel niile nọ na-ekiri ihe na-emenụ mgbe ọkụ ahụ dara, ebube Jehova wee dịkwasị n’ụlọ ahụ. Ha hulatara+ ala ozugbo kpudo ihu na pevment wee kpọọ isiala+ kelee Jehova, “n’ihi na ọ dị mma,+ n’ihi na obiọma* ya na-adịru mgbe ebighị ebi.”+
28 E nwere ihe yiri ụta+ nke na-apụta n’ígwé ojii n’ụbọchị mmiri na-ezo. Ọ bụ otú ahụ ka ìhè nke na-enwu gburugburu ya dị. O yiri ebube Jehova.+ Mgbe m hụrụ ya, m gburu ikpere n’ala, kpudo ihu n’ala,+ m wee malite ịnụ olu onye ahụ nke na-ekwu okwu.
3 Ma e wepụrụ ebube Chineke Izrel+ n’elu cherọb+ ọ na-adịbu wee wega ya n’ọnụ ụzọ ụlọ ahụ,+ o wee malite ịkpọku nwoke ahụ yi uwe linin,+ onye fanyere mpi ink nke odeakwụkwọ n’úkwù.