12 “Nke a bụ ihe Jehova nke ụsụụ ndị agha kwuru, ‘N’ebe a bụ́ mkpọmkpọ ebe nke mmadụ na ọbụna anụ ụlọ+ na-anọghị nakwa n’obodo ya niile, a ka ga-enwe ala ịta ahịhịa maka ndị ọzụzụ atụrụ bụ́ ndị na-eme ka atụrụ ha makpuru ala.’+
13 ya mere, nke a bụ ihe Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru: “M ga-esetịkwa aka m mee Idọm+ ihe, bipụ ma mmadụ ma anụ ụlọ n’ime ya.+ M ga-emekwa ka ọ bụrụ ebe tọgbọrọ n’efu malite na Timan,+ ruo Didan.+ A ga-eji mma agha bibie ha.
3 Ọ bụ ya mere ala a ga-eji ruo uju,+ onye ọ bụla bi n’ime ya ga-atụbọ, tinyere anụ ọhịa na anụ ufe nke eluigwe, ọbụna azụ̀ ndị dị n’oké osimiri ga-anwụ.+
3 “M ga-ekpochapụ mmadụ na anụmanụ.+ M ga-ekpochapụ anụ ufe nke eluigwe na azụ̀ ndị dị n’oké osimiri,+ na ihe ịsụ ngọngọ, tinyere ndị ajọ omume;+ m ga-egbuchapụkwa mmadụ n’elu ala,”+ ka Jehova kwuru.