23 bụ́ sọlfọ na nnu+ na ọkụ,+ nke mere na a gaghị akụ ihe n’ala ya dum, ihe agaghịkwa epulite na ya, ahịhịa ndụ agaghịkwa epu na ya, dị ka mgbe a kwaturu Sọdọm na Gọmọra,+ Adma+ na Zeboyim,+ bụ́ ndị Jehova ji iwe na ọnụma kwatuo;+
9 Otú ihu ha dị na-agbagide ha akaebe,+ ha na-ekwukwa banyere mmehie ha nke dị ka nke Sọdọm.+ Ha adịghị ezo ya ezo. Ahụhụ ga-adịrị mkpụrụ obi ha! N’ihi na ha ewetaworo onwe ha ọdachi.+
14 Ahụwokwa m ihe jọgburu onwe ya ndị amụma nọ na Jeruselem na-eme,+ ha na-akwa iko,+ na-ejekwa ije n’okwu ụgha;+ ha emewo ka aka ndị ajọ omume dị ike, ka onye ọ bụla n’ime ha wee ghara ịhapụ ihe ọjọọ ọ na-eme lọghachi.+ N’anya m, ha niile dị ka Sọdọm,+ ndị bi n’ime ya dịkwa ka Gọmọra.”+
7 Otú ahụkwa, mgbe Sọdọm na Gọmọra na obodo ndị dị ha gburugburu+ kwasịrị iko gabiga ókè, nweekwa mmekọahụ rụrụ arụ,+ dị ka ndị ahụ e kwuworo banyere ha, ha nwetara ntaramahụhụ ikpe ọmụma nke ọkụ ebighị ebi,+ ha wee ghọọrọ anyị ihe atụ ịdọ+ aka ná ntị.