4 Ọ ga-ekpe ikpe n’etiti mba niile,+ doziekwara+ ọtụtụ ndị+ okwu ha. Ha ga-akpụgharịkwa mma agha ha ka ha bụrụ mma ogè, kpụgharịakwa ube ha ka ha bụrụ mma ịkwa osisi.+ Mba agaghị ebuli mma agha buso mba ọzọ agha, ha agaghị amụkwa otú e si alụ agha.+
7 Mgbasa ịchịisi ya+ na udo ya ga-agbasa agaghị enwe ọgwụgwụ,+ n’elu ocheeze Devid+ nakwa n’alaeze ya iji mee ka o guzosie ike+ nakwa iji jiri ikpe ziri ezi+ na ezi omume+ mee ka ọ dịgide, malite ugbu a ruo mgbe ebighị ebi. Ekworo Jehova nke ụsụụ ndị agha ga-emezu ihe a.+
18 “A gakwaghị anụ banyere ime ihe ike n’ala gị, ma ọ bụ nụ banyere ibukọrọ ihe mmadụ na itikpọ ihe n’ókè nke ala gị.+ Ị ga-akpọ mgbidi gị Nzọpụta,+ kpọọkwa ọnụ ụzọ ámá gị Otuto.
12 n’ihi na anyị nwere mgba,+ ọ bụghị megide ọbara na anụ ahụ́, kama megide ọchịchị,+ megide ikike,+ megide ndị na-achị ụwa+ nke ọchịchịrị a, megide ìgwè ndị mmụọ ọjọọ+ n’ebe ndị dị n’eluigwe.