6 ‘N’ihi ya, chi ga-ejiri unu,+ ka ọhụụ wee ghara ịdị;+ ọchịchịrị ga-agbachiri unu, ka unu wee ghara ịdị na-agba afa. Anyanwụ ga-ada n’ihi ndị amụma, chi ga-ejibido ha.+
9 Ma unu bụ “agbụrụ a họọrọ, òtù ndị nchụàjà bụ́ ndị eze, mba dị nsọ,+ otu ndị pụrụ iche nke Chineke,+ ka unu wee kwusaa n’ebe niile ịdị mma”+ nke onye ahụ kpọpụtara unu n’ọchịchịrị wee kpọba unu n’ìhè ya dị ebube.+
8 M na-edetakwara unu iwu ọhụrụ, ya bụ, ihe mere eme nke bụ́ eziokwu banyere ya nakwa banyere unu, n’ihi na ọchịchịrị+ na-agabiga, ezi ìhè+ amalitelarị inwu.