10 E nwere ọkụ nke na-asọ asọ ka mmiri, nke si n’ihu ya na-asọpụta.+ E nwere puku kwuru puku ndị nọ na-ejere ya ozi,+ nakwa iri puku kwuru iri puku ndị guzo n’ihu ya.+ Ụlọikpe+ ahụ malitere ikpe, a saghekwara akwụkwọ dị iche iche.
5 Unu ga-agbaga na ndagwurugwu nke ugwu m;+ n’ihi na ndagwurugwu nke ugwu ahụ ga-eru n’Ezel. Unu ga-agba ọsọ, dị ka unu gbara n’ihi ala ọma jijiji ahụ mere n’ụbọchị Ọzaya eze Juda.+ Jehova bụ́ Chineke m ga-abịa,+ ya na ndị nsọ niile.+