Job
7 “Ọ̀ bụ na mmadụ efu enweghị ọrụ a manyere+ ya ịrụ n’elu ụwa,
Ọ̀ bụ na ụbọchị ya adịghịkwa ka ụbọchị onye ọrụ e goro ego?+
2 Dị ka ohu, ọ na-agụsi ya agụụ ike inwe ndò,+
Dịkwa ka onye ọrụ e goro ego, ọ na-echere ụgwọ ọrụ ya.+
3 Otú ahụ ka e si mee ka m nwee ọnwa+ ndị na-abaghị uru,
Ha ekenyewokwa m abalị ndị jupụtara ná nsogbu.+
4 Mgbe m dinara ala, ekwuru m, sị, ‘Olee mgbe m ga-ebili?’+
Mgbe chi jiri, obi anaghị ezu m ike ma ọlị ruo n’isi ụtụtụ.
6 Ụbọchị ndụ m na-agabiga ọsọ ọsọ+ karịa osisi nke onye na-ekwe ákwà,
Ọ na-agwụkwa n’enweghị olileanya.+
11 Mụ onwe m kwa agaghị emechi ọnụ m.
M ga-ekwu okwu n’ihi ahụhụ m na-ata;
M ga-ekwu okwu banyere nchegbu m n’ihi ihe na-ewute mkpụrụ obi m!+
13 Mgbe m sịrị, ‘Ihe ndina m ga-akasi m obi,
Ihe ndina m ga-enyere m aka buru nchegbu m,’
14 I jiriwo nrọ menye m ụjọ,
I jiriwokwa ọhụụ mee ka m tụwa ụjọ,
16 Ajụwo m ya;+ agaghị m adị ndụ ruo mgbe ebighị ebi.
Hapụ m, n’ihi na ụbọchị ndụ m bụ ume e kupụrụ ekupụ.+
17 Gịnị ka mmadụ efu bụ+ nke na ị na-azụlite ya,
Na ị na-etinye obi gị n’ebe ọ nọ,
18 Na ị na-elekọta ya kwa ụtụtụ,
Na-anwale ya n’oge ọ bụla?+