Job
6 Job wee zaa, sị:
2 A sị nnọọ na a tụrụ nsogbu+ m dum n’ihe ọ̀tụ̀tụ̀,
A sịkwa nnọọ na a ga-atụkwasị ahụhụ m n’ihe e ji atụ̀ ihe n’otu mgbe!
4 N’ihi na akụ́ nke Onye Pụrụ Ime Ihe Niile dị n’ime m,+
Nke mmụọ m na-aṅụ nsí ya;+
Oké ụjọ nke si n’ebe Chineke nọ ji m.+
6 À ga-eri ihe na-enweghị ụtọ n’etinyeghị ya nnu,
Ka mmiri na-alọ alọ nke ahịhịa mashmalo ò nwere ụtọ ọ bụla?
7 Mkpụrụ obi m ajụla imetụ ihe ọ bụla aka.
Ha dị ka ọrịa n’ihe oriri m.
8 A sị nnọọ na ihe m na-arịọ ga-eme,
A sịkwa nnọọ na Chineke ga-emezu olileanya m!
10 Ọbụna nke ahụ gaara akasi m obi;
M ga-amali elu n’ihi ọṅụ+ n’ihe mgbu m,
Ọ bụ ezie na ọ gaghị enwe ọmịiko, n’ihi na ezochighị m ihe Onye Nsọ+ kwuru.+
11 Olee ike m nwere, nke na m ga na-echere?+
Gịnịkwa ga-abụ njedebe m, nke na m ga-eme ka mkpụrụ obi m nọgide na-adị ndụ?
12 Ike m ọ̀ bụ ike nkume?
Ka è ji ọla kọpa mee ahụ́ m?
13 Ọ̀ bụ na enweghị m ike inyere onwe m aka,
Ka à napụwokwa m ike ịrụ ọrụ bara uru?
14 Onye ọ bụla nke jụrụ igosi mmadụ ibe ya obiọma,*+
Ya onwe ya agakwaghị atụ egwu Onye Pụrụ Ime Ihe Niile.+
16 Mkpụrụ mmiri emeela ka ha na-eji oji,
N’elu ha ka snoo na-ezo onwe ya.
17 Mgbe oge ruru, mmiri anaghị adịkwa na ha,+ ha adịkwaghị eme mkpọtụ;
Mgbe okpomọkụ bịara, ha na-ata.+
18 Ụzọ ha si asọfe gbagọrọ agbagọ;
Ha na-asọba n’ọzara wee taa.
20 Ihere na-eme ha n’ihi na ha nweburu nchekwube;
Ha abịarutewo ebe ahụ ma ha ahụghị ihe ha tụrụ anya ya.+
22 Ọ̀ bụ n’ihi na m sịrị, ‘Nyenụ m ihe,
Ma ọ bụ, ka unu si n’ihe unu nwere nye onyinye n’ihi m;
23 Napụtanụ m n’aka onye iro,+
Napụtakwanụ m n’aka ndị na-achị n’aka ike’?+
26 Ihe unu bu n’obi ime ọ̀ bụ ịtụchasị okwu,
Ebe ihe onye dara mbà n’obi na-ekwu+ bụ naanị ifufe ka ọ na-agwa?+
29 Biko, chegharịanụ echiche—ka ajọ omume ọ bụla ghara ibilite—
Ee, chegharịanụ echiche—ezi omume m ka dịkwa.+
30 Ajọ omume ọ̀ dị n’ire m,
Ka ọ̀ bụ na adịghị m amata ihe bụ́ ahụhụ?