Ilu
30 Okwu gbara ọkpụrụkpụ Egọ nwa Jeke kwuru, nke ọ gwara Itiel na Yukal.
3 Amụtabeghị m ihe bụ́ amamihe,
Amaghịkwa m ihe Onye Kacha Nsọ ma.
4 Ònye gbagorola n’eluigwe ma gbadata?+
Ònye ji ọbụ aka ya abụọ kpokọta ifufe?
Ònye ji ákwà kechie mmiri?+
Ònye kere ebe niile ụwa sọtụrụ?+
Gịnị bụ aha ya, gịnịkwa bụ aha ọkpara ya, ma ọ bụrụ na ị ma?
5 Okwu niile Chineke na-ekwu enweghị ntụpọ.*+
Chineke bụụrụ ndị na-agbaba n’ime ya ọta.+
7 Chineke, m na-arịọ gị ihe abụọ.
Ajụla imere m ha tupu mụ anwụọ.
8 Nyere m aka ka m ghara ịna-ekwu ihe na-abụghị eziokwu, ka m ghara ịna-agha ụgha.+
Emela ka m daa ogbenye, enyekwala m akụnụba.
Ekwekwala ka m daa ogbenye, ka m wee ghara izu ohi ma mebie aha Chineke m.
10 Ekwutọla onye na-eje ozi ná ntị nna ya ukwu,
Ka onye ahụ na-eje ozi ghara ịbụ gị ọnụ, ikpe ewee ma gị.+
Ha na-eripịa ndị ọ na-enweghị ka ọ hà ha
Nakwa ndị ogbenye.+
15 Etu mụrụ ụmụ abụọ ndị na-ebe ákwá, sị: “Nye m! Nye m!”
E nwere ihe atọ afọ na-anaghị eju eju,
Ihe anọ na-anaghị asị, “O zuola!”
16 Ha bụ ili*+ na akpa nwa nwaanyị aga
Na ala na-anaghị enweta mmiri,
Nakwa ọkụ nke na-anaghị asị, “O zuola!”
18 E nwere ihe atọ gbara m gharịị,
Ihe anọ m na-aghọtabeghị:
19 Otú ugo si efegharị n’eluigwe,
Otú agwọ si arịgharị n’elu nkume,
Otú ụgbọ mmiri si aga n’oké osimiri,
Nakwa ije nwoke na nwaanyị.
20 Ihe nwaanyị na-akwa iko na-eme bụ:
O richaa, ya ehichaa ọnụ ya,
Sịzie, “E nweghị ihe ọjọọ m mere.”+
21 E nwere ihe atọ na-emenye ụwa egwu,
Ihe anọ ndị mmadụ na-enweghị ike idi:
Mgbe onye iberiibe rifere nri ókè,
23 Mgbe ọ bụ nwaanyị a kpọrọ asị ka nwoke gara lụọ,
Nakwa mgbe nwa agbọghọ na-eje ozi nọchiri nne ya ukwu.+
29 E nwere ihe atọ otú ha si aga mara ezigbo mma,
Ihe anọ otú ha si aga dị ebube.
30 Ha bụ ọdụm, bụ́ anụ kacha anụ ọhịa niile ike,
Nke na-anaghị agbara onye ọ bụla ọsọ;+
31 Na nkịta ntá; na mkpi;
Nakwa eze nke ya na ìgwè ndị agha ya so.