Aịzaya
61 Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova nyere m mmụọ ya,+
N’ihi na Jehova tere m mmanụ izi ndị dị umeala n’obi ozi ọma.+
O zitere m ka m kechie ọnyá ndị obi gbawara,
Ka m gwa ndị e ji eji na a hapụla ha,
Ka m meghee anya ndị mkpọrọ,+
2 Ka m kwusaa afọ Jehova na-emere ndị mmadụ amara*
Na ụbọchị Chineke anyị ga-akwụ ndị iro ya ụgwọ,+
Ka m kasie ndị niile na-eru uju obi,+
3 Ka m lekọta ndị na-eruru Zayọn uju,
Ka m nye ha ákwà isi ha ga-eji dochie ntụ,
Ka m nye ha mmanụ ka ha na-enwe aṅụrị kama iru uju,
Ka m nye ha ákwà ha ga-eyiri na-eto m kama ịda mbà n’obi.
4 Ha ga-arụghachi ebe ndị e bibiri ebibi dịwara kemgbe ụwa.
Ha ga-arụ ebe ndị tọgbọ nkịtị n’oge ochie.+
Ha ga-eme ka obodo ndị e bibiri ebibi dị ọhụrụ,+
Ya bụ, obodo ndị tọgbọ nkịtị malite n’otu ọgbọ ruo n’ọgbọ ọzọ.+
5 “Ndị ala ọzọ ga-abịa na-azụ ìgwè ewu na atụrụ unu.
Ndị mba ọzọ+ ga na-akọrọ unu ubi unu, na-elekọtakwa ubi vaịn unu.+
6 Ma, ha ga-akpọ unu ndị nchụàjà Jehova.+
Ha ga-asịkwa na unu bụ ndị ozi Chineke anyị.
Unu ga-eri akụ̀ mba dị iche iche.+
Unu ga-ejikwa ebube* ha na-eme ọnụ.
7 E menyere unu ihere. Ma ugbu a, unu ga-enweta ngọzi okpukpu abụọ.
A gaghịzi emenye ndị m ihere, kama, ha ga na-eti mkpu ọṅụ n’ihi na a gọziela ha.
N’eziokwu, ha ga-enweta ngọzi okpukpu abụọ n’ala ha.+
Ha ga na-aṅụrị ọṅụ ruo mgbe ebighị ebi.+
8 N’ihi na mụnwa, bụ́ Jehova, hụrụ ikpe ziri ezi n’anya.+
M kpọrọ izu ohi na ajọ omume asị.+
M ga na-akwụ ndị m ụgwọ ọrụ ha.
Mụ na ha ga-agbakwa ndụ ga-adịru mgbe ebighị ebi.+
9 Ụmụ* ha ga-abụ ndị a ma ama ná mba dị iche iche.+
Ndị si n’ezinụlọ ha ga-abụkwa ndị a ma ama n’obodo niile.
10 M ga-aṅụrị ezigbo ọṅụ n’ihi Jehova.
Obi ga-abụ m* sọ aṅụrị n’ihi Chineke m.+
N’ihi na o yikwasịla m nzọpụta ka uwe.+
O yikwasịla m ezi omume ka uwe,
Otú nwoke na-alụ nwaanyị ọhụrụ si eke ákwà n’isi ka onye nchụàjà,+
Nakwa otú nwaanyị a na-alụ ọhụrụ si eji ihe ndị o ji achọ mma chọọ onwe ya mma.
Ọ ga-eme ihe ndị a otú ahụ ala si eme ka mkpụrụ puo
Nakwa otú ahụ ubi si eme ka ihe a kụrụ na ya puo.