Abụ Solomọn
2 “Otú ahụ okooko lili na-adị n’etiti ahịhịa ogwu,
Ka onye m hụrụ n’anya dị n’etiti ụmụ nwaanyị.”
3 “Otú ahụ osisi apụl na-adị n’etiti osisi ndị dị n’oké ọhịa,
Ka onye m hụrụ n’anya dị n’etiti ụmụ nwoke.
Ọ na-agụsi m ike ka m nọrọ na ndò ya,
Mkpụrụ osisi ya na-atọkwa m ụtọ.
5 Nyenụ m achịcha mkpụrụ vaịn na apụl ka m taa;+
Ka obi dị m ụtọ, ka m wee nweta ume,
N’ihi na anaghị m enweta onwe m maka na onye m hụrụ n’anya anọghị m nso.
7 Ụmụ nwaanyị Jeruselem, eji m ele+ na nne mgbada bi n’ọhịa
Na-arịọ unu ka unu ṅụọrọ m iyi
Na unu agaghị eme ka m hụ onye ọ bụla n’anya ebe ọ bụ na ọ dịbeghị m n’obi.+
8 Anụrụ m olu onye m hụrụ n’anya.
Lee, ọ bịawala.
Ọ na-arị ugwu ukwu, na-awụkwa ọsọ n’ugwu nta.
9 Onye m hụrụ n’anya yiri ele. O yiri oké mgbada.+
Lee, o guzo n’azụ mgbidi anyị.
O si na windo na-ele anya.
O si na mpio ụlọ na-enyobata anya.
10 Onye m hụrụ n’anya kwuru okwu. Ọ sịrị m:
‘Ọdị m n’obi, bilie.
Asampete m, bịa ka anyị pụọ.
Mmiri akwụsịla izo, mmiri alaala.
13 Mkpụrụ mbụ osisi fig mịrị achaala.+
Osisi vaịn amaala ifuru, na-esikwa ísì ọma.
Onye m hụrụ n’anya, bilie.
Asampete m, bịa ka anyị pụọ.
14 Nduru m, ka m hụ gị ma nụ olu gị+
N’ebe zoro ezo ná nnukwu nkume,+
N’ebe zoro ezo n’ọnụ ọnụ ugwu,
N’ihi na olu gị dị ụtọ, ị makwara mma.’”+
15 “Jiderenụ anyị nkịta ọhịa,
Ụmụ nkịta ọhịa ndị na-emebisị ubi vaịn,
N’ihi na ubi vaịn anyị amaala ifuru.”