‘Mmụọ Nsọ Na-enyocha Ihe Ndị Miri Emi Nke Chineke’
‘Mmụọ nsọ na-enyocha ihe niile, ọbụna ihe ndị miri emi nke Chineke.’—1 KỌR. 2:10.
1. Olee ọrụ mmụọ nsọ na-arụ nke Pọl kwuru banyere ya ná 1 Ndị Kọrịnt 2:10, oleekwa ajụjụ ndị dị mkpa nke a kpalitere?
ANYỊ kwesịrị nnọọ inwe obi ụtọ na mmụọ nsọ Jehova na-arụ ọrụ. Akwụkwọ Nsọ kpọrọ mmụọ nsọ ihe inyeaka, onyinye, ihe na-agba àmà, nakwa ihe na-arịọrọ anyị arịrịọ. (Jọn 14:16; Ọrụ 2:38; Rom 8:16, 26, 27) Pọl onyeozi kwuru ọrụ ọzọ dị mkpa mmụọ nsọ na-arụ. Ọ sịrị: “Mmụọ ahụ na-enyocha ihe niile, ọbụna ihe ndị miri emi nke Chineke.” (1 Kọr. 2:10) N’eziokwu, Jehova na-eji mmụọ nsọ ya eme ka anyị ghọta eziokwu ndị miri emi dị na Baịbụl. Anyị agaraghị ama ihe ọ bụla banyere nzube Jehova ma a sị na mmụọ nsọ anaghị enyere anyị aka. (Gụọ 1 Ndị Kọrịnt 2:9-12.) Ma, ụfọdụ ajụjụ ndị dị mkpa bụ: Olee otú ‘mmụọ nsọ si enyocha ihe ndị miri emi nke Chineke’? Ole ndị Jehova si n’aka ha mee ka a mata ihe ndị miri emi na narị afọ mbụ nke Oge Anyị? Olee otú mmụọ nsọ si enyocha ihe ndị miri emi nke Chineke n’oge anyị a, ò sikwa n’aka ole ndị eme nke a?
2. Olee ọrụ abụọ mmụọ nsọ ga na-arụ?
2 Jizọs kwuru ọrụ abụọ mmụọ nsọ ga na-arụ. Obere oge tupu ya anwụọ, ọ gwara ndịozi ya, sị: “Ihe inyeaka ahụ, bụ́ mmụọ nsọ, nke Nna m ga-ezite n’aha m, ga-akụziri unu ihe niile ma chetara unu ihe niile m gwara unu.” (Jọn 14:26) Nke a na-egosi na mmụọ nsọ ga na-akụziri Ndị Kraịst ihe, na-echetakwara ha ihe. Otú ọ ga-esi na-akụziri Ndị Kraịst ihe bụ na ọ ga na-enyere ha aka ịghọta ihe ndị ha na-aghọtaghị na mbụ. Otú ọ ga-esi na-echetara ha ihe bụ na ọ ga na-enyere ha aka icheta ihe a gwara ha, nyekwara ha aka ka ha mee ya otú ahụ e si gwa ha ya.
Na Narị Afọ Mbụ
3. Olee ihe Jizọs kwuru nke gosiri na a ga-eji nwayọọ nwayọọ mee ka ndị na-eso ụzọ ya ghọta “ihe ndị miri emi nke Chineke”?
3 Jizọs kụziiri ndị na-eso ụzọ ya ọtụtụ eziokwu ha na-amabughị. Ma, a ka nwere ọtụtụ ihe ha ga-amụ. Jizọs gwara ndịozi ya, sị: “M ka nwere ọtụtụ ihe m ga-agwa unu, ma unu apụghị ịghọta ha ugbu a. Otú ọ dị, mgbe ihe inyeaka ahụ bịarutere, bụ́ mmụọ nke eziokwu ahụ, ọ ga-eduzi unu wee nyere unu aka ịghọta eziokwu niile.” (Jọn 16:12, 13) Ihe a Jizọs kwuru gosiri na a ga-eji nwayọọ nwayọọ jiri mmụọ nsọ mee ka ndị na-eso ụzọ ya ghọta eziokwu ndị miri emi dị na Baịbụl.
4. Na Pentikọst nke afọ 33 O.A., olee otú mmụọ nsọ si kụziere ndị na-eso ụzọ Jizọs ihe, oleekwa otú o si chetara ha ihe?
4 “Mmụọ nke eziokwu ahụ” bịarutere na Pentikọst nke afọ 33 O.A. A wụkwasịrị ihe dị ka otu narị Ndị Kraịst na iri abụọ zukọrọ na Jeruselem mmụọ nsọ. A hụrụ ihe gosiri na nke a mere, nụkwa ihe mmụọ nsọ mere ka ha kwuo. (Ọrụ 1:4, 5, 15; 2:1-4) Ndị na-eso ụzọ Jizọs kwuru okwu n’asụsụ dị iche iche “banyere ihe ndị dị ebube nke Chineke.” (Ọrụ 2:5-11) Ọ bụ mgbe ahụ ka oge ruru ka e mee ka ha ghọta ihe ọhụrụ. Joel onye amụma buru amụma banyere mmụọ nsọ ahụ a wụkwasịrị ha. (Joel 2:28-32) Ndị na-ege ntị atụghị anya na ọ bụ otú ahụ ka a ga-esi emezu amụma ahụ. N’ihi ya, Pita onyeozi biliri kọwaa ihe ihe ahụ na-emenụ pụtara. (Gụọ Ọrụ Ndịozi 2:14-18.) Otú mmụọ nsọ si kụziere ha ihe bụ na o mere ka Pita ghọta na ihe a merenụ bụ mmezu nke amụma ahụ e buru n’oge ochie. Mmụọ nsọ chetakwaara ha ihe n’ihi na Pita kwughachiri ma ihe Joel dere ma abụ ọma abụọ Devid dere. (Ọma 16:8-11; 110:1; Ọrụ 2:25-28, 34, 35) Ihe mmadụ niile ahụ gbakọrọnụ nụrụ ma hụ bụ n’ezie ihe ndị miri emi nke Chineke.
5, 6. (a) Mgbe Pentikọst nke afọ 33 O.A. gachara, olee ajụjụ dị mkpa ka a zaa banyere ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ? (b) Ole ndị ka e si n’aka ha jụọ ajụjụ ndị ahụ, oleekwa otú e si kpebie ihe a ga-eme?
5 A ka nwere ọtụtụ ihe e kwesịrị ime ka o dokwuo Ndị Kraịst narị afọ mbụ anya. Dị ka ihe atụ, a ka nwere ihe ụfọdụ gbagwojuru ha anya banyere ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ nke malitere n’ụbọchị Pentikọst ahụ. Ọ̀ bụ naanị ndị Juu na ndị na-eso ụzọ ndị Juu so n’ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ? Ndị Jentaịl hà nwere ike iso na ya, e jirikwa mmụọ nsọ tee ha mmanụ? (Ọrụ 10:45) Tupu ndị ikom bụ́ ndị Jentaịl esoro n’ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ, à ga-ebi ha ùgwù, ha ana-edebekwa Iwu Mozis? (Ọrụ 15:1, 5) Ajụjụ ndị a dị oké mkpa. Mmụọ Jehova dị ha mkpa ka ha wee nwee ike inyocha ihe ndị a miri emi. Ma, ole ndị ka mmụọ nsọ ga-eji rụọ ọrụ a?
6 Ọ bụ ụmụnna nwere ihe ùgwù n’ọgbakọ ka e si n’aka ha jụọ nke ọ bụla n’ajụjụ ndị ahụ. Pita, Pọl, na Banabas gara nnọkọ ahụ òtù na-achị isi nwere, ma kọọ otú Jehova si na-emeso ndị Jentaịl a na-ebighị ùgwù. (Ọrụ 15:7-12) Mgbe òtù na-achị isi tụlechara ihe a ha kọrọ nakwa ihe e kwuru n’Akwụkwọ Nsọ Hibru, mmụọ nsọ nyeere ha aka ikpebi ihe a ga-eme. Ha degaziiri ọgbakọ dị iche iche akwụkwọ ozi gwa ha ihe ha kpebiri.—Gụọ Ọrụ Ndịozi 15:25-30; 16:4, 5; Efe. 3:5, 6.
7. Olee otú e si mee ka a ghọta eziokwu ndị miri emi nke Chineke?
7 E ji akwụkwọ ozi Jọn, Pita, Jems, na Pọl, mee ka a ghọtakwuo ọtụtụ ihe ndị ọzọ. Ma, mgbe e dechara Akwụkwọ Nsọ Ndị Kraịst, e nwere mgbe o ruru Chineke akwụsị inye ndị mmadụ onyinye ibu amụma, kwụsịkwa ikpughere ha ihe. (1 Kọr. 13:8) Mmụọ nsọ ọ̀ ga-anọgide na-akụziri Ndị Kraịst ihe, na-echetakwara ha ihe? Ọ̀ ga-anọgide na-enyere Ndị Kraịst aka inyocha ihe ndị miri emi nke Chineke? E nwere amụma gosiri na ọ ga-eme otú ahụ.
N’Oge Ikpeazụ
8, 9. Ole ndị ga-enwu gbaa ma mee ka a ghọta Okwu Chineke n’oge ikpeazụ?
8 Otu mmụọ ozi kwuru banyere oge ikpeazụ, sị: “Ndị nwere nghọta ga na-enwu dị ka ìhè mbara igwe; ndị na-eme ka ọtụtụ ndị mmadụ bụrụ ndị ezi omume ga na-enwukwa dị ka kpakpando ruo mgbe ebighị ebi, ọbụna ruo mgbe niile ebighị ebi. . . . Ezi ihe ọmụma ga-abakwa ụba.” (Dan. 12:3, 4) Ole ndị ga-abụ ndị ahụ nwere nghọta, oleekwa ndị ga na-enwu gbaa? Jizọs ji ihe atụ ahụ o ji ọka wit na ata mee nyere anyị aka ịmata ndị ọ ga-abụ. Mgbe ọ na-ekwu banyere “ọgwụgwụ nke usoro ihe a,” ọ sịrị: “N’oge ahụ, ndị ezi omume ga-enwu gbaa dị ka anyanwụ n’alaeze nke Nna ha.” (Mat. 13:39, 43) Mgbe Jizọs na-akọwa ihe ihe a o kwuru pụtara, ọ sịrị na “ndị ezi omume” ahụ bụ “ụmụ nke alaeze,” ya bụ, Ndị Kraịst e tere mmanụ.—Mat. 13:38.
9 Ọ̀ bụ Ndị Kraịst niile e tere mmanụ “ga-enwu gbaa”? E nwere ike ikwu na ọ bụ ha niile n’ihi na Ndị Kraịst niile kwesịrị ịna-ekwusa ozi ọma, na-eme ndị mmadụ ka ha bụrụ ndị na-eso ụzọ Jizọs, na-ewulirịtakwa ibe ha elu mgbe ha gara ọmụmụ ihe. Ọ bụ ndị e tere mmanụ ga-ebute ụzọ n’ihe ndị a. (Zek. 8:23) Ihe ọzọ bụ na n’oge ikpeazụ, a ga-eme ka a ghọta ihe ndị miri emi. E ‘mechiri’ amụma ahụ Daniel buru ruo n’oge ikpeazụ. (Dan. 12:9) Olee otú mmụọ nsọ ga-esi enyocha ihe ndị a miri emi, oleekwa ndị ọ ga-esi n’aka ha eme nke a?
10. (a) Ole ndị ka mmụọ nsọ na-esi n’aka ha eme ka a ghọta eziokwu ndị miri emi n’oge ikpeazụ a? (b) Kwuo otú e si mee ka eziokwu ndị a kọwara banyere oké ụlọ nsọ ime mmụọ Jehova dokwuo anya.
10 Mgbe ọ bụla oge ruru ka e mee ka ihe dị n’Okwu Chineke dokwuo anya n’oge anyị a, mmụọ nsọ na-enyere Òtù Na-achị Isi aka ịghọta eziokwu ndị miri emi a na-aghọtabughị. Ọ bụ Òtù Na-achị Isi na-anọchite anya “ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi, onye nwekwara uche,” ha nọkwa n’isi ụlọ ọrụ Ndịàmà Jehova. (Mat. 24:45; 1 Kọr. 2:13) Ọ bụrụ na e nwee ihe e kwesịrị ịgbanwe otú e si aghọta ya, Òtù Na-achị Isi na-ezukọ tụlee ya. (Ọrụ 15:6) Ha na-ebipụta ihe ọ bụla ha chọpụtara ka mmadụ niile nwee ike ịgụ ya. (Mat. 10:27) Ọ bụrụ na ka oge na-aga e nwee ihe e kwesịrị ime ka o dokwuo anya, ha na-akọwa ya otú e kwesịrị isi akọwa ya.—Gụọ igbe bụ́ “Otú Mmụọ Nsọ Si Mee Ka A Ghọta Ihe Ụlọ Nsọ Ime Mmụọ Pụtara.”
Otú Ọrụ Mmụọ Nsọ Na-arụ Si Abara Anyị Uru Taa
11. Olee otú omume mmụọ nsọ na-eme ka a ghọta ihe ndị miri emi nke Chineke si abara Ndị Kraịst niile uru taa?
11 Otú mmụọ nsọ si eme ka a ghọta ihe ndị miri emi nke Chineke na-abara Ndị Kraịst niile kwesịrị ntụkwasị obi uru. Taa, anyị na-eme ihe Ndị Kraịst mere na narị afọ mbụ, ya bụ, anyị na-amụ ihe mmụọ nsọ na-enyere anyị aka ịghọta. Anyị na-echetakwa ha ka oge na-aga ma mee ha. (Luk 12:11, 12) Ọ bụghị iwu na anyị ga-agụ oké akwụkwọ tupu anyị aghọta eziokwu ndị miri emi e bipụtaara anyị. (Ọrụ 4:13) Olee ihe ndị nwere ike inyere anyị aka ịghọtakwu ihe ndị miri emi nke Chineke? Ka anyị tụlee ụfọdụ n’ime ha.
12. Olee mgbe anyị kwesịrị ikpe ekpere ka Chineke nye anyị mmụọ nsọ?
12 Rịọ Chineke n’ekpere ka o nye gị mmụọ nsọ. Tupu anyị amụwa akwụkwọ ọ bụla e ji amụ Baịbụl, anyị kwesịrị ikpe ekpere ka mmụọ nsọ duzie anyị. Anyị kwesịrị ime otú ahụ a sịgodị na ọ bụ naanị anyị chọrọ ịmụ ya ma ọ bụkwanụ na anyị enwechaghị oge. Obi ga-adị Nna anyị nke eluigwe ụtọ ma anyị jiri obi umeala rịọ ya arịrịọ a. Jehova ga-emere anyị ihe ahụ Jizọs kwuru, ya bụ, ọ ga-aza ekpere anyị ji obi anyị dum kpee ma nye anyị mmụọ nsọ ya n’efu.—Luk 11:13.
13, 14. Olee otú ịkwadebe ọmụmụ ihe si enyere anyị aka ịghọta ihe ndị miri emi nke Chineke?
13 Na-akwadebe ọmụmụ ihe. Ohu ahụ na-enye anyị ‘nri n’oge kwesịrị ekwesị.’ Otú o si arụ ọrụ ya bụ ibipụtara anyị akwụkwọ ndị e ji amụ Baịbụl nakwa ịhaziri anyị ihe ndị anyị na-amụ nakwa ọmụmụ ihe ọgbakọ. E nwere ezigbo ihe mere e ji gwa “òtù ụmụnna dum” ka ha na-amụ ihe. (1 Pita 2:17; Kọl. 4:16; Jud 3) Ọ bụrụ na anyị agbaa mbọ na-eme ihe dị iche iche ohu ahụ na-agwa anyị, anyị na-egosi na anyị na-erubere mmụọ nsọ isi.—Mkpu. 2:29.
14 Mgbe anyị na-akwadebe ọmụmụ ihe, anyị kwesịrị ịgụ amaokwu Akwụkwọ Nsọ ndị e depụtara n’ihe anyị na-agụ ma gbalịa chọpụta otú nke ọ bụla si gbasa isiokwu anyị na-amụ. Ọ bụrụ na anyị na-eme otú a, anyị ga-eji nke nta nke nta ghọtakwuo Baịbụl. (Ọrụ 17:11, 12) Ọ bụrụ na anyị na-agụ amaokwu ndị ahụ, mmụọ nsọ ga-enyere anyị aka icheta ha. Ihe ọzọ bụ na ọ bụrụ na anyị agụọ amaokwu ahụ e dere n’akwụkwọ anyị na-agụ na Baịbụl, ọ ga-eme ka anyị na-echeta ebe amaokwu ahụ dị na Baịbụl.
15. Gịnị mere i ji kwesị ịmụ akwụkwọ ọ bụla e bipụtara, oleekwa otú i si amụ ha?
15 Na-agụ akwụkwọ ọ bụla e ji amụ Baịbụl e bipụtara. Ọ bụghị akwụkwọ niile e bipụtara ka anyị na-amụ n’ọmụmụ ihe, ma, ihe mere e ji bipụta ha bụ ka anyị gụọ ha wee mụta ihe na ha. E budị anyị n’obi ebipụta akwụkwọ ndị anyị na-ekesara ọhaneze. N’ụwa a ndị mmadụ na-anaghị enwe ohere, anyị na-echerekarị ndị mmadụ ma ọ bụ ihe ọzọ. Ọ bụrụ na anyị ewere akwụkwọ ndị e ji amụ Baịbụl anyị na-agụbeghị ma ọ bụ ndị anyị na-agụchabeghị, anyị nwere ike iji ohere ahụ gụtụkwuo ha. Otú ụfọdụ ndị si agụ akwụkwọ ọhụrụ ndị e bipụtara bụ igere ha egere mgbe ha na-aga n’ụzọ ma ọ bụ mgbe ha nọ n’ụgbọala. E mere nchọnchọ nke ọma wee dee akwụkwọ ndị a ka onye ọ bụla nwee ike ịgụ ha ma ghọtakwuo Okwu Chineke.—Hab. 2:2.
16. Olee uru ị ga-erite ma ọ bụrụ na i detuo ajụjụ ndị gbatara gị n’obi ma nweta azịza ha?
16 Tụgharịa uche. Mgbe ị na-agụ Baịbụl ma ọ bụ akwụkwọ ndị e ji amụ Baịbụl, wepụta oge chebara ihe ndị ị na-agụ echiche. Ọ bụrụ na ị gbalịa ghọta otú ihe a na-ekwu si na-aga, ajụjụ ụfọdụ nwere ike ịgbata gị n’obi. I nwere ike idetu ajụjụ ndị ahụ ma mee nchọnchọ ma e mechaa. Ọ na-abụkarị mgbe anyị na-eme nchọnchọ n’ihe masịrị anyị ka anyị na-amụ ihe nke ọma. Anyị agaghị echefu ihe anyị ghọtara na ya, ọ ga-enyekwara anyị aka n’ọdịnihu.—Mat. 13:52.
17. Olee otú unu si enwe ofufe ezinụlọ, ma ọ bụkwanụ ọmụmụ ihe onwe onye?
17 Wepụta oge ị ga-eji na-enwe ofufe ezinụlọ. Òtù Na-achị Isi agbaala anyị niile ume iwepụta otu uhuruchi ma ọ bụkwanụ oge ọ bụla ọzọ kwa izu, nke naanị anyị ma ọ bụ anyị na ezinụlọ anyị ga-eji na-amụ ihe. Mgbanwe a gbanwere oge anyị ji amụ ihe ga-eme ka anyị nwee ohere na-eme nke a. Gịnị ka unu na-amụ ná mgbede unu ji enwe Ofufe Ezinụlọ? Ụfọdụ ndị na-agụ Baịbụl, meekwa nchọnchọ iji ghọta ihe ndị ha na-aghọtachaghị, ma dee ihe ndị ha chọpụtara ná nkenke na Baịbụl ha. Ọtụtụ ezinụlọ na-ewepụta oge tụlee otú ihe ha na-amụ si gbasa ezinụlọ ha. Ụfọdụ ndị isi ezinụlọ na-ahọrọ ihe ha chere ezinụlọ ha kwesịrị ilebara anya ma ọ bụkwanụ ha amụọ isiokwu ma ọ bụ tụlee ajụjụ a gwara onye ọ bụla n’ime ha ka ọ gaa mee nchọnchọ banyere ya. O doro anya na unu ga-enwe isiokwu ndị ọzọ unu nwere ike ịtụle ka oge na-aga.a
18. Gịnị mere anyị ekwesịghị ịda mbà n’ịmụ eziokwu ndị miri emi dị n’Okwu Chineke?
18 Jizọs kwuru na mmụọ nsọ ga-enyere ndị na-eso ụzọ ya aka. N’ihi ya, anyị ekwesịghị ịda mbà n’ịmụ eziokwu ndị miri emi dị n’Okwu Chineke. Eziokwu ndị ahụ so ‘n’ihe ọmụma Chineke’ nke na-enweghị atụ, a gwakwara anyị ka anyị na-achọ ha. (Gụọ Ilu 2:1-5.) Ha na-eme ka anyị ghọta ọtụtụ ihe banyere “ihe Chineke kwadebeere ndị hụrụ ya n’anya.” Ka anyị na-agba mbọ ịmụtakwu ihe dị n’Okwu Jehova, mmụọ nsọ ga-enyere anyị aka n’ihi na “mmụọ ahụ na-enyocha ihe niile, ọbụna ihe ndị miri emi nke Chineke.”—1 Kọr. 2:9, 10.
[Ihe e dere n’ala ala peeji]
Gịnị Ka Ị Ga-aza?
• Olee ụzọ abụọ mmụọ nsọ si enyere anyị aka inyocha “ihe ndị miri emi nke Chineke”?
• Na narị afọ mbụ, ole ndị ka mmụọ nsọ si n’aka ha mee ka a ghọta eziokwu ndị miri emi?
• Olee otú mmụọ nsọ si enyere anyị aka ịghọta ihe ụfọdụ taa?
• Gịnị ka ị ga-eme ma ọ bụrụ na ị chọrọ ka ọrụ mmụọ nsọ na-arụ baara gị uru?
[Igbe dị na peeji nke 22]
Otú Mmụọ Nsọ Si Mee Ka A Ghọta Ihe Ụlọ Nsọ Ime Mmụọ Pụtara
Otu n’ime “ihe ndị miri emi nke Chineke” nke e mere ka a ghọta na narị afọ mbụ bụ na ụlọikwuu ahụ nakwa ụlọ nsọ nke nọchiri ya sere onyoonyo ụlọ nsọ ime mmụọ. Pọl kpọrọ ya ‘ezi ụlọikwuu ahụ, nke Jehova wuru, ọ bụghị mmadụ.’ (Hib. 8:2) Oké ụlọ nsọ ime mmụọ a bụ ndokwa Jehova mere ka anyị si n’aka onye nchụàjà bụ́ Jizọs Kraịst nakwa n’àjà ọ chụrụ na-abịakwute Chineke.
‘Ezi ụlọikwuu ahụ’ malitere n’afọ 29 O.A., bụ́ mgbe e mere Jizọs baptizim Jehova ewee nabata ka ọ bụrụ ya ga-abụ àjà zuru okè a ga-achụ. (Hib. 10:5-10) Mgbe Jizọs nwụrụ, a kpọlitekwa ya n’ọnwụ, ọ banyere n’Ebe Kasị Nsọ n’ụlọ nsọ ime mmụọ ahụ ma chee uru àjà ahụ e ji ya chụọ “n’ihu Chineke n’onwe ya.”—Hib. 9:11, 12, 24.
E nwere ebe Pọl onyeozi kwuru na Ndị Kraịst e tere mmanụ ‘na-eto eto ka ha ghọọrọ Jehova ụlọ nsọ.’ (Efe. 2:20-22) Ụlọ nsọ a na ‘ezi ụlọikwuu ahụ’ o mechara kwuo banyere ya n’akwụkwọ ozi o degaara ndị Hibru hà bụ otu? Ruo ọtụtụ afọ, ndị ohu Jehova chere na ha bụ otu. O yiri ka à kwadebere Ndị Kraịst e tere mmanụ n’ụwa ka ha wee nwee ike ịghọ “nkume” n’ụlọ nsọ Jehova nke dị n’eluigwe.—1 Pita 2:5.
Ma, ka afọ 1971 na-eru nso, ndị na-edu ndú so n’ohu ahụ malitere ịghọta na ụlọ nsọ ahụ Pọl kwuru okwu ya n’akwụkwọ Ndị Efesọs abụghị oké ụlọ nsọ ime mmụọ nke Jehova. Ọ bụrụ na ọ bụ Ndị Kraịst e tere mmanụ, bụ́ ndị a kpọlitere n’ọnwụ, bụ ‘ezi ụlọikwuu ahụ,’ mgbe ọ ga-amalite bụ mgbe a malitere ịkpọlite ha n’ọnwụ “n’oge ọnụnọ Onyenwe anyị.” (1 Tesa. 4:15-17) Ma mgbe Pọl na-ekwu banyere ụlọikwuu ahụ, o dere, sị: “Ụlọikwuu a bụ ihe atụ maka oge a kara aka nke ruworo ugbu a.”—Hib. 9:9.
Ka e jichara nlezianya tụlee amaokwu ndị a na amaokwu ndị ọzọ dị na Baịbụl, ọ bịara doo anya na ụlọ nsọ ime mmụọ ahụ abụghị nke a ka na-achọ ịrụ arụ nakwa na Ndị Kraịst e tere mmanụ abụghị “nkume” a na-akwadebe n’ụwa ka e jiri ya rụọ ya. Kama nke ahụ, Ndị Kraịst e tere mmanụ na-eje ozi n’ogige nke ụlọ nsọ ime mmụọ ahụ nakwa n’ebe Nsọ ya, ha na-achụkwara Chineke “àjà otuto” kwa ụbọchị.—Hib. 13:15.
[Foto dị na peeji nke 23]
Olee otú anyị ga-esi na-aghọtakwu “ihe ndị miri emi nke Chineke”?