Daniel
12 “N’oge ahụ, Maịkel,*+ nnukwu onyeisi+ na-enyere ndị obodo gị aka,* ga-ebili. A ga-enwe oge nsogbu nke a na-enwetụbeghị ụdị ya kemgbe a malitere inwe mba ruo n’oge ahụ. N’oge ahụ, e nweghị ihe ga-eme ndị obodo gị,+ ndị niile e dere aha ha n’akwụkwọ.+ 2 Ọtụtụ n’ime ndị nwụrụ anwụ* ga-eteta. Ụfọdụ ga-enweta ndụ ebighị ebi. Ma a ga-akọcha ndị ọzọ, ihere ga-emekwa ha ruo mgbe ebighị ebi.
3 “Ndị ma ihe ga na-enwu ka ìhè mbara igwe. Ndị na-enyere ọtụtụ ndị aka ka ha bụrụ ndị ezi omume ga na-enwukwa ka kpakpando ruo mgbe niile ebighị ebi.
4 “Daniel, akọsala* okwu ndị a, mechiekwa akwụkwọ a ruo n’oge ọgwụgwụ.+ Ọtụtụ ndị ga na-amụ ya nke ọma,* eziokwu a ga-amụta ga-ehikwa nne.”+
5 Mụnwa bụ́ Daniel lere anya hụ ndị mmụọ ozi abụọ ọzọ ka ha guzo n’ebe ahụ. Otu guzo n’otu akụkụ mmiri ahụ, onye nke ọzọ eguzoro n’akụkụ nke ọzọ.+ 6 Otu wee jụọ onye ahụ yi uwe linin,+ onye guzo n’elu mmiri ahụ, sị: “Olee mgbe ihe ndị a dị ịtụnanya ga-emezucha?” 7 M nụrụ ka onye ahụ yi uwe linin, onye guzo n’elu mmiri ahụ, zara ya. Mgbe ọ na-aza ya, o weliri aka nri ya na aka ekpe ya n’eluigwe ma jiri aha Onye ahụ na-adị ndụ ruo mgbe ebighị ebi ṅụọ iyi,+ sị: “Ọ ga-adịru otu oge a kara aka, oge abụọ a kara aka, na ọkara otu oge.* Ozugbo a kụrisịrị ike nke ndị nsọ,+ ihe ndị a niile ga-emezu.”
8 M nụrụ ihe o kwuru, ma aghọtaghị m ya.+ M wee sị: “Onyenwe m, gịnịzi ga-eme ma ihe a niile mechaa?”
9 O wee sị m: “Daniel, gawa, n’ihi na a ga-ezochi okwu ndị a, mechiekwa ya ruo n’oge ọgwụgwụ.+ 10 Ọtụtụ ndị ga-asacha onwe ha, meekwa onwe ha ka ha dị ọcha,+ a ga-anụchakwa ha. Ndị ajọ omume ga na-eme ajọ omume, e nweghịkwa onye ajọ omume ga-aghọta ihe ndị a. Ma ndị ma ihe ga-aghọta ha.+
11 “Malite mgbe e wepụrụ àjà a na-achụ mgbe niile+ nakwa mgbe a kwụwara ihe arụ nke na-eweta mbibi,+ a ga-enwe otu puku ụbọchị, narị ụbọchị abụọ na iri itoolu (1,290).
12 “Onye na-atụ anya ihe ndị a,* onye rutekwara n’otu puku ụbọchị, narị ụbọchị atọ na iri atọ na ise (1,335), ga-enwe obi ụtọ.
13 “Ma gịnwa, jisie ike ruo n’ọgwụgwụ. Ị ga-ezu ike, ma ị ga-ebili ka i nweta òkè gị mgbe ụbọchị ndị a gwụchara.”+