Zekaraya
8 Jehova nke ụsụụ ndị agha gwara m okwu ọzọ, sị: 2 “Ihe a bụ ihe Jehova nke ụsụụ ndị agha kwuru, ‘M ga-anụrụ Zayọn ọkụ n’obi,+ m ga-ejikwa oké iwe gbachitere ya ma chebe ya.’”
3 “Ihe a bụ ihe Jehova kwuru, ‘M ga-alaghachi na Zayọn,+ birikwa na Jeruselem.+ A ga-akpọ Jeruselem obodo eziokwu,*+ kpọọkwa ugwu Jehova nke ụsụụ ndị agha ugwu nsọ.’”+
4 “Ihe a bụ ihe Jehova nke ụsụụ ndị agha kwuru, ‘Ndị agadi nwoke na ndị agadi nwaanyị ga-anọdụ ala ọzọ n’ámá ndị dị na Jeruselem. Onye ọ bụla n’ime ha ga-eji mkpara ya n’aka maka na ọ dịteela ndụ aka.+ 5 Ụmụaka ga-eju n’ámá ndị dị n’obodo na-egwuri egwu.’”+
6 “Ihe a bụ ihe Jehova nke ụsụụ ndị agha kwuru, ‘Ọ bụ eziokwu na n’oge ahụ, o nwere ike ịdị ndị fọrọ n’ime ndị a ka ihe siri ezigbo ike, ò kwesịrị ịbụrụ mụnwa ihe siri ezigbo ike?’ Ọ bụ ihe Jehova nke ụsụụ ndị agha kwuru.”
7 “Ihe a bụ ihe Jehova nke ụsụụ ndị agha kwuru, ‘M na-azọpụta ndị m n’ala ndị dị n’ebe ọwụwa anyanwụ nakwa n’ala ndị dị n’ebe ọdịda anyanwụ.+ 8 M ga-akpọbata ha, ha ga-ebirikwa na Jeruselem.+ Ha ga-abụ ndị m, m ga-abụkwara ha Chineke+ onye eziokwu* na onye ezi omume.’”
9 “Ihe a bụ ihe Jehova nke ụsụụ ndị agha kwuru, ‘Nweenụ obi ike,*+ unu ndị na-anụ okwu ndị a ndị amụma na-ekwu,+ bụ́ otu okwu ahụ e kwuru n’ụbọchị a tọrọ ntọala ụlọ Jehova nke ụsụụ ndị agha maka ịrụ ụlọ nsọ. 10 N’ihi na tupu oge ahụ, a naghị akwụ ma mmadụ ma anụmanụ ụgwọ ọrụ.+ E nweghị onye na-apụ ma na-abata n’udo n’ihi onye iro, maka na m mere ka mmadụ niile na-emegide ibe ha.’
11 “Jehova nke ụsụụ ndị agha kwuru, sị, ‘Ma ugbu a, agaghị m emeso ndị fọrọ ná ndị a otú m mere n’ụbọchị ndị gara aga.+ 12 N’ihi na a ga-agha mkpụrụ udo. Osisi vaịn ga-amị mkpụrụ ya. Ala ga-emepụta ihe,+ eluigwe ga-emekwa ka igirigi daa. M ga-eme ka ndị fọrọ ná ndị a nweta ihe a niile.+ 13 Otú ahụ unu bụụrụ mba dị iche iche ihe e ji abụ ọnụ,+ unu ụlọ Juda na ụlọ Izrel, otú ahụ ka m ga-azọpụta unu, unu abụrụzie ngọzi.+ Unu atụla egwu.+ Nweenụ obi ike.’*+
14 “N’ihi na ihe a bụ ihe Jehova nke ụsụụ ndị agha kwuru, ‘“Otú ahụ mụnwa bụ́ Jehova nke ụsụụ ndị agha kpebiri ime ka ọdachi dakwasị unu maka na ndị nna nna unu kpasuru m iwe, agbanweghịkwa m obi m,+ 15 otú ahụ ka m kpebiri n’oge a imere Jeruselem na ụlọ Juda ihe ọma.+ Unu atụla egwu.”’+
16 “‘Ihe ndị a ka unu ga na-eme: Na-agwanụ ibe unu eziokwu.+ Mgbe unu na-ekpe ikpe n’ọnụ ụzọ ámá, na-ekwunụ eziokwu, na-emekwanụ ka udo dịrị.+ 17 Unu akpala nkata n’ime obi unu ka unu mee ibe unu ihe ọjọọ,+ unu aṅụkwala iyi ụgha,+ n’ihi na m kpọrọ ihe a niile asị.’ Ọ bụ ihe Jehova kwuru.”+
18 Jehova nke ụsụụ ndị agha gwara m okwu ọzọ, sị: 19 “Ihe a bụ ihe Jehova nke ụsụụ ndị agha kwuru, ‘Ọnụ unu na-ebu n’ọnwa nke anọ,+ ọnụ unu na-ebu n’ọnwa nke ise,+ ọnụ unu na-ebu n’ọnwa nke asaa,+ na ọnụ unu na-ebu n’ọnwa nke iri+ ga-abụrụ ụlọ Juda oge obi ụtọ na ọṅụ, oge ememme obi ụtọ.+ N’ihi ya, hụnụ eziokwu na udo n’anya.’
20 “Ihe a bụ ihe Jehova nke ụsụụ ndị agha kwuru, ‘N’eziokwu, ndị dị iche iche na ndị bi n’ọtụtụ obodo ga-abịa. 21 Ndị bi n’otu obodo ga-agakwuru ndị bi n’obodo ọzọ, sị: “Ka anyị jiri obi anyị niile gaa rịọ Jehova ka o meere anyị amara* ma chọọ Jehova nke ụsụụ ndị agha. Anyị* ga-agakwa.”+ 22 Ọtụtụ ndị na mba ndị dị ike ga-abịa chọọ Jehova nke ụsụụ ndị agha na Jeruselem,+ rịọkwa Jehova ka o meere ha amara.’*
23 “Ihe a bụ ihe Jehova nke ụsụụ ndị agha kwuru, ‘N’oge ahụ, mmadụ iri ndị na-asụ asụsụ* niile e nwere ná mba dị iche iche+ ga-ejide uwe* onye Juu.* N’eziokwu, ha ga-ejide ya, sị: “Anyị ga-eso unu,+ n’ihi na anyị anụla na Chineke nọnyeere unu.”’”+