Abụ Ọma
Maskil. Abụ ọma Devid, mgbe ọ nọ n’ime ọgba.+ Ekpere.
142 Eji m olu m kpọkuo Jehova ka o nyere m aka;+
Eji m olu m malite itiku Jehova ka o meere m amara.+
2 M nọ na-awụpụ nchegbu m n’ihu ya dị ka mmiri.+
M nọ na-akọ nhụjuanya m n’ihu ya,+
3 Mgbe ike gwụrụ mmụọ m+ n’ime m.
Mgbe ahụ, gị onwe gị maara okporo ụzọ m.+
Ha siiri m ọnyà+
N’ụzọ m si agafe.+
4 Lee anya n’aka nri hụ
Na ọ dịghị onye na-eme ka ọ̀ ma onye m bụ.+
Enwekwaghị m ebe mgbaba;+
Ọ dịghị onye na-ajụ ase mkpụrụ obi m.+