Ọpụpụ 22:25 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 25 “Ọ bụrụ na ị gbazinye otu n’ime ndị m ego, bụ́ onye nọ n’ahụhụ,+ nke bi gị nso, abụrụla ya onye na-anara ọmụrụ nwa. Unu anala ya ọmụrụ nwa.+ Diuterọnọmi 23:19 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 19 “Emela ka nwanne gị kwụọ ọmụrụ nwa,+ ọmụrụ nwa ego, ọmụrụ nwa nri,+ ọmụrụ nwa ihe ọ bụla mmadụ pụrụ ịnara ọmụrụ nwa na ya. Nehemaya 5:7 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 7 M wee tụlee ya n’obi m ma malite ịkatọ+ ndị a ma ama na ndị osote onye na-achị achị, m wee sị ha: “Ọmụrụ+ nwa ka unu na-anara, onye nke ọ bụla n’aka nwanne ya.” M mekwara ndokwa ka e nwee nnukwu nzukọ n’ihi ha.+ Abụ Ọma 15:5 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 5 Ọ dịghị ana ọmụrụ nwa n’ego ọ gbazinyere mmadụ,+Ọ dịghịkwa eri ngarị iji megide onye aka ya dị ọcha.+A gaghị eme ka onye na-eme ihe ndị a maa jijiji ma ọlị.+ Ilu 28:8 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 8 Onye na-amụba ihe onwunwe ya site n’ịnara ọmụrụ nwa+ na ụma na-akpakọbara ya onye na-emere ndị ọ na-enweghị ka ọ hà ha amara.+ Ezikiel 18:13 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 13 Ọ gbazinyewo mmadụ ego ma nara ọmụrụ nwa,+ ọ narawokwa ụma,+ ọ gaghị adị ndụ. O mewo ihe arụ a niile.+ A ga-egburịrị ya. Ọbara ya ga-adị ya n’isi.+
25 “Ọ bụrụ na ị gbazinye otu n’ime ndị m ego, bụ́ onye nọ n’ahụhụ,+ nke bi gị nso, abụrụla ya onye na-anara ọmụrụ nwa. Unu anala ya ọmụrụ nwa.+
19 “Emela ka nwanne gị kwụọ ọmụrụ nwa,+ ọmụrụ nwa ego, ọmụrụ nwa nri,+ ọmụrụ nwa ihe ọ bụla mmadụ pụrụ ịnara ọmụrụ nwa na ya.
7 M wee tụlee ya n’obi m ma malite ịkatọ+ ndị a ma ama na ndị osote onye na-achị achị, m wee sị ha: “Ọmụrụ+ nwa ka unu na-anara, onye nke ọ bụla n’aka nwanne ya.” M mekwara ndokwa ka e nwee nnukwu nzukọ n’ihi ha.+
5 Ọ dịghị ana ọmụrụ nwa n’ego ọ gbazinyere mmadụ,+Ọ dịghịkwa eri ngarị iji megide onye aka ya dị ọcha.+A gaghị eme ka onye na-eme ihe ndị a maa jijiji ma ọlị.+
8 Onye na-amụba ihe onwunwe ya site n’ịnara ọmụrụ nwa+ na ụma na-akpakọbara ya onye na-emere ndị ọ na-enweghị ka ọ hà ha amara.+
13 Ọ gbazinyewo mmadụ ego ma nara ọmụrụ nwa,+ ọ narawokwa ụma,+ ọ gaghị adị ndụ. O mewo ihe arụ a niile.+ A ga-egburịrị ya. Ọbara ya ga-adị ya n’isi.+