12 Ụmụ Izrel agaghị enwe ike ibuso ndị iro ha agha.+ Ha ga-atụgharị si n’ihu ndị iro ha gbaa ọsọ, n’ihi na ha aghọwo ihe a ga-ebibi ebibi. Agaghị m anọnyere unu ọzọ ọ gwụla ma unu kpochapụrụ ihe a ga-ebibi ebibi nke dị n’etiti unu.+
14 Jehova wee weso Izrel iwe dị ọkụ,+ o wee nyefee ha n’aka ndị na-akwakọrọ ihe,+ ha wee na-akwakọrọ ihe ha; o wee were ha resị ndị iro ha gbara ha gburugburu,+ ha enweghịkwa ike iguzo n’ihu ndị iro ha.+
4 ma ọ́ bụghị mmadụ ihuru ala n’etiti ndị mkpọrọ, ndị mmadụ ana-adakwa n’etiti ndị e gburu egbu?+ N’ihi ihe a dum, iwe ya adajụbeghị, kama aka ya ka setịrị esetị.+
10 N’ihi na ọ bụrụ na unu egbuo ndị agha niile nke ndị Kaldia, bụ́ ndị na-ebuso unu agha,+ ndị fọdụrụ n’ime ha abụrụ naanị ndị e merụrụ ahụ́ nke ukwuu,+ onye ọ bụla n’ime ha ga-esi n’ụlọikwuu ya bilie gbaa obodo a ọkụ.”’”