7 Ma Jehova achọghị ịla ụlọ Devid n’iyi,+ n’ihi ọgbụgba ndụ+ ya na Devid gbara, dị nnọọ ka o kwuru na ya ga-enye ya+ na ụmụ ya oriọna ga na-enwu mgbe niile.+
16 “‘Mụ onwe m, bụ́ Jizọs, zigara mmụọ ozi m ka ọ gbaara unu àmà banyere ihe ndị a maka ọgbakọ ndị a. Abụ m mgbọrọgwụ+ Devid, bụrụkwa nwa ya.+ Abụkwa m kpakpando ụtụtụ nke na-enwu gbaa.’”+