34 Ruo taa, ha na-eme ihe dị ka okpukpe mbụ ha si dị.+ Ọ dịghị onye n’ime ha na-atụ egwu Jehova,+ ọ dịghịkwa onye na-agbaso ụkpụrụ ya na mkpebi ikpe+ ya na iwu+ ya na ntụziaka+ Jehova nyere ụmụ Jekọb,+ bụ́ onye o mere ka aha ya bụrụ Izrel;+
48Nụrụnụ ihe a, ụlọ Jekọb, unu ndị na-aza aha Izrel,+ ndị sikwa na mmiri Juda pụta,+ unu ndị na-eji aha Jehova aṅụ iyi,+ ndị na-akpọ aha Chineke Izrel,+ ma ọ bụghị n’eziokwu, ọ bụghịkwa n’ezi omume.+