25Nke a bụ okwu ruru Jeremaya ntị banyere ndị Juda niile n’afọ nke anọ nke ọchịchị Jehoyakim+ nwa Josaya, bụ́ eze Juda, ya bụ, n’afọ mbụ nke ọchịchị Nebukadreza, bụ́ eze Babịlọn;
3Nebukadneza bụ́ eze kpụrụ ihe oyiyi+ ọlaedo nke ịdị elu ya dị kubit iri isii, obosara ya dịkwa kubit isii. O guzobere ya na mbara ala Dura, n’ógbè Babịlọn a na-achị achị.+
33 Ozugbo ahụ,+ okwu ahụ mezuru n’isi Nebukadneza, a chụpụrụ ya n’etiti ụmụ mmadụ, o wee malite ịta ahịhịa dị ka ehi, igirigi nke eluigwe dekwara ahụ́ ya ruo mgbe ntutu isi ya toro ogologo dị ka ábụ́bà ugo, mbọ́ ya etookwa dị ka mbọ́ nnụnụ.+
37 “Ugbu a, mụ onwe m, Nebukadneza, na-eto ma na-ebuli Eze eluigwe elu, na-ajakwa ya mma,+ n’ihi na ọrụ ya niile bụ eziokwu, ụzọ ya niile bụkwa ikpe ziri ezi,+ nakwa n’ihi na o nwere ike iweda ndị ji mpako na-eje ije ala.”+