3 “‘Ọ bụrụ na àjà ya bụ àjà nsure ọkụ+ nke a ga-eji anụ si n’ìgwè ehi chụọ, ọ ga-eweta oké, nke ahụ́ dị mma.+ N’ọnụ ụzọ ụlọikwuu nzute ka ọ ga-eji obi ya chee ya n’ihu Jehova.+
39 “‘Ihe ndị a ka unu ga na-achụrụ Jehova n’àjà mgbe unu na-eme ememme unu n’oge a kara aka,+ ma e wezụga onyinye unu kwere ná nkwa+ na onyinye afọ ofufo+ unu ga na-achụ n’àjà dị ka àjà nsure ọkụ+ unu na àjà ọka+ unu na àjà ihe ọṅụṅụ+ unu na àjà udo unu.’”+
6 Ọ bụkwa n’ebe ahụ ka unu ga-eweta àjà nsure ọkụ+ unu na àjà nkịtị unu na otu ụzọ n’ụzọ iri+ unu na onyinye unu na-eweta+ na onyinye unu kwere ná nkwa+ na onyinye afọ ofufo+ unu na anụ ndị e bu ụzọ mụọ n’ìgwè ehi unu nakwa n’ìgwè ewu na atụrụ+ unu.