2 O wee merie ndị Moab,+ ma jiri ụdọ e ji atụ̀ ihe tụọ ha, o mere ka ha dinara ala ka o wee jiri ụdọ ahụ tụta ụzọ abụọ ka e gbuo ha, tụtakwa otu ụzọ zuru ezu ka e debe ha ndụ;+ ndị Moab wee ghọọ ndị na-ejere Devid ozi+ ka ha wee na-atụrụ ya ụtụ.+
6 E mesịa, Devid debegasịrị ndị agha na-eche nche na Siria nke Damaskọs.+ Ndị Siria wee ghọọ ndị na-ejere Devid ozi, na-atụrụ ya ụtụ.+ Jehova wee na-azọpụta Devid ebe ọ bụla ọ gara.+
14 n’agụnyeghị ihe ndị na-agba ahịa+ na ndị ahịa na-ebubata. Ndị eze niile nke ndị Arab+ na ndị gọvanọ ala ahụ na-ewetakwara Sọlọmọn ọlaedo na ọlaọcha.