6 O wee wute Devid nke ukwuu,+ n’ihi na ndị ahụ sịrị ka a tụọ ya nkume;+ n’ihi na ọ na-ewute ha niile ná mkpụrụ obi,+ onye nke ọ bụla n’ihi ụmụ ya ndị ikom na ụmụ ya ndị inyom. Devid wee jiri Jehova bụ́ Chineke ya na-eme onwe ya ka ọ dị ike.+
10 Atụla egwu, n’ihi na m nọnyeere gị.+ Elegharịla anya n’ụjọ, n’ihi na abụ m Chineke gị.+ M ga-eme ka ị dị ike.+ M ga-enyere gị aka.+ M ga-eji aka nri m+ nke ezi omume+ jidesie gị ike.’