28 “A na-anụ mkpọtụ nke ndị na-agba ọsọ nakwa nke ndị si n’ala Babịlọn na-agbapụ+ ka ha gaa Zayọn kọsaa ọbọ Jehova bụ́ Chineke anyị bọrọ,+ ya bụ, ọbọ ọ bọrọ n’ihi ụlọ nsọ ya.+
2 Jehova bụ Chineke nke chọrọ ofufe a na-ekewaghị ekewa,+ bụrụkwa onye na-abọ ọbọ; Jehova na-abọ ọbọ,+ na-ewekwa iwe.+ Jehova ga-abọ ọbọ n’ahụ́ ndị iro+ ya, ọ na-eweso ndị iro+ ya iwe.
19 Ndị m hụrụ n’anya, unu abọrọla onwe unu ọbọ,+ kama nyenụ ọnụma ahụ ohere;+ n’ihi na e dere, sị: “Ọ bụ m nwe ịbọ ọbọ; m ga-akwụ ụgwọ, ka Jehova kwuru.”+
6 ka onye ọ bụla ghara iru n’ókè nke imebi ihe na ịmanye aka n’ihe ndị ruuru nwanna ya n’okwu a,+ n’ihi na ọ bụ Jehova na-enye ntaramahụhụ maka ihe ndị a niile,+ dị nnọọ ka anyị gwara unu na mbụ, gbaakwara unu àmà nke ọma.+