8 Ókè ya gbagokwara ndagwurugwu nwa Hinọm,+ ruo ná mkpọda nke obodo ndị Jibọs+ nke dị na ndịda, ya bụ, Jeruselem;+ ókè ya gbagoro n’elu ugwu nke chere ihu na ndagwurugwu Hinọm n’ebe ọdịda anyanwụ, nke dị na nsọtụ ndagwurugwu Refeyim+ n’ebe ugwu.
10 O wee mee ka a ghakwara ịnọ na Tofet,+ nke dị na ndagwurugwu ụmụ Hinọm,+ na-efe ofufe, ka onye ọ bụla ghara isurere* Molek+ nwa ya nwoke ma ọ bụ nwa ya nwaanyị n’ọkụ.+
3 Ya onwe ya surekwara ihe nsure ọkụ+ na ndagwurugwu nwa Hinọm,+ sureekwa ụmụ ya ndị ikom+ n’ọkụ, dị ka ihe arụ+ nke mba ndị Jehova chụpụrụ n’ihu ụmụ Izrel mere si dị.+
31 Ha ewuwo ebe ndị dị elu na Tofet,+ nke dị na ndagwurugwu nwa Hinọm,+ iji suree ụmụ ha ndị ikom na ụmụ ha ndị inyom n’ọkụ,+ nke bụ́ ihe m na-enyeghị n’iwu, ọ bataghịkwa m n’obi.’+