5 Ndị isi+ nke ndị bụ́ nna ndị Juda na nke ndị Benjamin, tinyere ndị nchụàjà na ndị Livaị, wee bilie, ya bụ, ndị niile mmụọ+ nke ezi Chineke kpaliri, ka ha lawa gaa wughachi ụlọ Jehova,+ nke dị na Jeruselem.
3 Ọtụtụ ndị ga-ejekwa wee sị: “Bịanụ+ ka anyị gbagoo n’ugwu Jehova, n’ụlọ Chineke nke Jekọb; ọ ga-akụziri anyị ụzọ ya, anyị ga-ejekwa ije n’ụzọ ya.”+ N’ihi na ọ bụ na Zayọn ka iwu ga-esi pụta, okwu Jehova ga-esikwa na Jeruselem pụta.+
5 Ha ga na-ajụ ajụjụ ụzọ e si aga Zayọn, ha ga-eche ihu n’ụzọ ahụ,+ na-asị, ‘Bịanụ ka anyị na Jehova gbaa ndụ nke ga-adịru mgbe ebighị ebi, nke a na-agaghịkwa echefu echefu.’+
2 Ọtụtụ mba ga-ejekwa, sị: “Bịanụ+ ka anyị gbagoo n’ugwu Jehova, n’ụlọ Chineke nke Jekọb;+ ọ ga-akụziri anyị ụzọ ya,+ anyị ga-ejekwa ije n’ụzọ ya.”+ N’ihi na ọ bụ na Zayọn ka iwu ga-esi pụta, okwu Jehova ga-esikwa na Jeruselem pụta.+