Diuterọnọmi 4:26 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 26 ana m ewere eluigwe na ụwa+ dị ka ndị akaebe megide unu taa, na unu ga-alarịrị n’iyi ọsọ ọsọ pụọ n’ala ahụ unu na-agafe Jọdan inweta. Ụbọchị unu ga-ebi na ya agaghị adị ọtụtụ, n’ihi na a ga-alarịrị unu n’iyi.+ Abụ Ákwá 2:2 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 2 Jehova elodawo ebe obibi niile nke Jekọb, o nweghịkwara nke ọ bụla n’ime ha ọmịiko.+N’oké iwe ya, ọ kwatuwo ebe niile e wusiri ike+ nke ada bụ́ Juda.O mewo ka ọ daruo ala,+ o merụwo alaeze ya+ na ndị isi ya.+ Ezikiel 9:10 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 10 Ma anya m agaghị eme ebere,+ agaghịkwa m enwe ọmịiko.+ M ga-eme ka ha jiri isi ha buru ihe ha metara.”+
26 ana m ewere eluigwe na ụwa+ dị ka ndị akaebe megide unu taa, na unu ga-alarịrị n’iyi ọsọ ọsọ pụọ n’ala ahụ unu na-agafe Jọdan inweta. Ụbọchị unu ga-ebi na ya agaghị adị ọtụtụ, n’ihi na a ga-alarịrị unu n’iyi.+
2 Jehova elodawo ebe obibi niile nke Jekọb, o nweghịkwara nke ọ bụla n’ime ha ọmịiko.+N’oké iwe ya, ọ kwatuwo ebe niile e wusiri ike+ nke ada bụ́ Juda.O mewo ka ọ daruo ala,+ o merụwo alaeze ya+ na ndị isi ya.+
10 Ma anya m agaghị eme ebere,+ agaghịkwa m enwe ọmịiko.+ M ga-eme ka ha jiri isi ha buru ihe ha metara.”+