31 N’ihi na Jehova bụ́ Chineke gị bụ Chineke ebere.+ Ọ gaghị agbahapụ gị ma ọ bụ laa gị n’iyi ma ọ bụ chefuo ọgbụgba ndụ+ nna nna gị hà nke ọ ṅụụrụ ha n’iyi.
13 Otu ụzọ n’ụzọ iri ka ga-anọ n’ime ya,+ ọ ga-aghọkwa ihe a ga-agba ọkụ ọzọ, dị ka osisi ukwu, dịkwa ka oké osisi, bụ́ ndị úkwù ha na-afọdụ+ ma e gbutuo ha;+ mkpụrụ dị nsọ ka úkwù ya ga-abụ.”+
20 Ọ ga-erukwa n’ụbọchị ahụ, na ọ dịkwaghị mgbe ndị fọdụrụ n’Izrel+ na ndị lanahụrụ alanahụ n’ụlọ Jekọb ga-adabere n’onye ahụ nke na-eti ha ihe,+ ha ga-adaberekwa n’ebe Jehova, bụ́ Onye Nsọ Izrel,+ nọ, n’eziokwu.+
7 “Ndị fọdụrụ n’ụlọ Jekọb+ ga-adị ka igirigi nke si n’ebe Jehova nọ+ n’etiti ọtụtụ ndị, dị ka mmiri na-ezosi ike n’elu ahịhịa,+ bụ́ nke na-adịghị adabere n’ebe mmadụ nọ, nke na-adịghịkwa echere ụmụ mmadụ.+