15 Mgbe unu gbasara ọbụ aka unu,+ m na-ewepụ anya m n’ebe unu nọ.+ Ọ bụ ezie na unu na-ekpe ọtụtụ ekpere,+ adịghị m ege ntị;+ aka unu jupụtara n’ọbara.+
3 “Nwa nke mmadụ, obi ndị ikom ndị a dị n’arụsị ha ndị na-asọ oyi ka nsị, ihe ịsụ ngọngọ nke na-eme ka ha jehie ka ha debere n’ihu ha.+ M̀ ga-ekwe ka ha jụta m ihe ọ bụla?+