2 E nwere ọhụụ siri ike+ a kọọrọ m: Onye aghụghọ na-aghọ aghụghọ, onye na-ebukọrọ ihe mmadụ na-ebukọrọkwa ihe mmadụ.+ Ilam, gbagoo! Midia,+ nọchibido ya! Emewo m ka ude niile a na-asụ n’ihi ya kwụsị.+
11 Pịanụ akụ́ unu.+ Burunụ ọta okirikiri unu. Jehova akpaliwo mmụọ nke ndị eze ndị Midia,+ n’ihi na o bu n’obi imegide Babịlọn,+ iji laa ya n’iyi. N’ihi na ọ bụ ịbọ ọbọ Jehova, bụ́ ọbọ ọ ga-abọ n’ihi ụlọ nsọ ya.+
5 “Ma, lee! e nwere anụ ọhịa ọzọ, bụ́ nke abụọ, o yiri anụ ọhịa bea.+ O weliri otu akụkụ ya elu,+ ọ kpụkwa ọgịrịga atọ n’ọnụ, tagide ha ezé; ha nọkwa na-asị ya, ‘Bilie, rie anụ buru ibu.’+