33 O wee malite ịchụ àjà n’elu ebe ịchụàjà nke ọ rụrụ na Betel n’abalị iri na ise n’ọnwa asatọ, n’ọnwa nke o chepụtara n’onwe ya;+ o wee meere ụmụ Izrel ememme, chụọkwa àjà n’elu ebe ịchụàjà iji suree ihe nsure ọkụ.+
7 n’ihi njehie ha na njehie ndị nna nna ha n’otu mgbe ahụ,”+ ka Jehova kwuru. “N’ihi na ha esurewo ihe nsure ọkụ n’elu ugwu ukwu, ha akọchawokwa m+ n’elu ugwu nta,+ m ga-ebu ụzọ tụọ ụgwọ ọrụ ha atụ̀ ma wụnye ya n’obi uwe ha.”+
15 N’ihi na ndị m echefuwo m+ n’ihi na ha na-esurere ihe na-abaghị uru ihe nsure ọkụ,+ n’ihi na ha na-emekwa ka ndị mmadụ sụọ ngọngọ n’ụzọ ha,+ bụ́ ụzọ nke dịwara kemgbe oge ochie,+ wee soro okporo ụzọ ọzọ, bụ́ ụzọ a na-awụghị ájá,
2 Ugbu a, ha na-emekwu mmehie, jirikwa ọlaọcha ha na-emere onwe ha ihe oyiyi a wụrụ awụ,+ bụ́ arụsị dị iche iche,+ dị ka nghọta ha si dị, ha niile bụ aka ọrụ ndị omenkà.+ Ha na-agwa ha, sị, ‘Ka ụmụ mmadụ ndị na-achụ àjà susuo ụmụ ehi ọnụ.’+