12 Eze kwatukwara ebe ịchụàjà niile ndị eze Juda wuru, bụ́ ndị dị n’elu ụlọ elu+ Ehaz, kwatusịakwa ebe ịchụàjà+ Manase wuru n’ogige abụọ ndị dị n’ụlọ Jehova, e mesịa, o gwepịara ha n’ebe ahụ, o wee wụfuo ntụ ha n’iyi ndagwurugwu Kidrọn.
3 O wee wughachi ebe ndị dị elu+ Hezekaya nna ya kwaturu,+ wukwaara Bel+ ebe ịchụàjà+ ma mee ogwe osisi ndị dị nsọ.+ O wee malite ịkpọrọ ìgwè ihe niile dị n’eluigwe+ isiala,+ na-efekwa ha ofufe.+
13 Ụlọ ndị dị na Jeruselem na ụlọ ndị eze Juda, bụ́ ndị na-adịghị ọcha, ya bụ, ụlọ niile dị n’elu ụlọ bụ́ ebe ha na-esurere ìgwè ihe ndị dị n’eluigwe+ ihe nsure ọkụ ma na-awụsara chi ọzọ dị iche iche àjà ihe ọṅụṅụ,+ ga-adị ka Tofet.’”+
29 Ndị Kaldia, bụ́ ndị na-ebuso obodo a agha, ga-abata mụnye obodo a ọkụ wee gbaa ya ọkụ,+ tinyere ụlọ ndị dị n’elu ụlọ bụ́ ebe ha nọ na-esurere Bel ihe nsure ọkụ, na-awụsakwara chi ọzọ dị iche iche àjà ihe ọṅụṅụ iji kpasuo m iwe.’+