14 ndị m+ bụ́ ndị a kpọkwasịrị aha m+ ewee weda onwe ha ala+ wee kpee ekpere+ ma chọọ ihu m,+ hapụkwa ụzọ ọjọọ ha,+ mụ onwe m ga-anọ n’eluigwe nụ+ wee gbaghara ha mmehie ha,+ m ga-agwọkwa ala ha.+
13 O wee na-ekpeku ya ekpere, nke mere na ọ nabatara+ arịrịọ ya. O wee nụ arịrịọ ọ na-arịọ ka e meere ya amara. O wee mee ka ọ lọghachi Jeruselem, n’ọchịchị ya;+ Manase wee mara na Jehova bụ ezi Chineke.+
10 Ònye ledara ụbọchị ihe nta anya?+ Ha ga-aṅụrị ọṅụ+ ma hụ eriri e ji atụ̀ ihe kwụ ọtọ n’aka Zerọbabel. Anya asaa ndị a bụ anya Jehova.+ Ha na-awagharị n’ụwa dum.”+