21 Job wee zaa, sị:
2 “Geenụ ntị nke ọma n’ihe m na-ekwu,
Ka ọ bụụrụ unu ihe ngụgụ obi.
3 Nweerenụ m ndidi, mụ onwe m ga-ekwukwa okwu;
M kwuchaa, onye ọ bụla n’ime unu nwere ike ịkwa m emo.+
4 Ọ̀ bụ mmadụ ka m na-ekwupụtara nchegbu m?
Ka ọ̀ bụ gịnị mere mmụọ m ji nwee ndidi?
5 Leenụ m anya, ka o jukwa unu anya,
Kpuchienụ aka n’ọnụ.+
6 Ọ bụrụ na mụ echeta ya, obi adịghịkwa ezu m ike,
Anụ ahụ́ m na-ama jijiji.
7 Gịnị mere ndị ajọ omume ji adị ndụ,+
Kaa nká, nweekwa akụ̀ dị ukwuu?+
8 Ha na-ahụ ka ụmụ ha ghọrọ mmadụ,
Hụkwa ka ụmụ ụmụ ha ghọrọ mmadụ.
9 Ụlọ ha bụ udo, bụrụkwa ebe ụjọ na-adịghị,+
Ụtarị Chineke adịghịkwa edesa ha n’ahụ́.
10 Oké ehi ya na-agba nne ehi, o wee dịrị ime, ọbara ọcha ya adịghịkwa ala n’iyi;
Nne ehi ya na-amụ nwa,+ ime adịghịkwa apụ ya.
11 Ha na-ezipụ ụmụ okoro ha dị nnọọ ka ìgwè ewu na atụrụ,
Ụmụ ha ndị ikom na-awụgharịkwa.
12 Ha na-eji obere ịgbà na ụbọ akwara na-agụ egwú,+
Ha na-aṅụrịkwa ọṅụ mgbe ha na-anụ ụda ọjà.
13 Ha na-ekpori ndụ ụbọchị ha niile,+
Ma n’otu ntabi anya, ha na-agbada na Shiol.
14 Ha na-asịkwa ezi Chineke, ‘Hapụ anyị!+
Anyị enweghịkwa mmasị n’ịmata ụzọ gị.+
15 Gịnị ka Onye Pụrụ Ime Ihe Niile bụ, nke mere anyị ga-eji jeere ya ozi,+
Oleekwa uru anyị na-erite na anyị arịọwo ya arịrịọ?’+
16 Lee! Ihe ịga nke ọma ha adịghị n’aka ha.+
Atụmatụ ndị ajọ omume dị anya n’ebe m nọ.+
17 Ugboro ole ka e menyụtụworo oriọna ndị ajọ omume,+
Ọ̀ bụkwa ugboro ole ka ọdachi ha na-adakwasị ha?
Ugboro ole ka o jitụworo iwe ya mee ka mbibi bịakwasị ha?+
18 Hà na-adị ka ahịhịa ọka ifufe na-ebugharị,+
Dịkwa ka igbogbo ọka nke oké ifufe bupụrụ?
19 Chineke ga-ewere ihe ọjọọ mmadụ mere debere ụmụ ya;+
Ọ ga-akwụ ya ụgwọ ka o wee mara.+
20 Anya ya ga-ahụ ọdịda ya,
Ọ bụkwa ọnụma Onye Pụrụ Ime Ihe Niile ka ọ ga-aṅụ.+
21 N’ihi na, gịnị ga na-enye ya obi ụtọ n’ụlọ ya mgbe ọ na-anọkwaghị,
Mgbe a ga-egbubi ọnwa ole o nwere ọkara?+
22 Ọ̀ ga-akụziri Chineke ihe,+
Mgbe Chineke na-ekpe ndị dị elu ikpe?+
23 Onye dị otú a ga-anwụ mgbe ihe niile zuuru ya,+
Mgbe ọ na-enweghị nchegbu na mgbe obi ruru ya ala;
24 Mgbe apata ụkwụ ya bụ abụba abụba,
Mgbe ụmị ọkpụkpụ ya nwekwara mmiri.
25 Onye nke ọzọ ga-anwụ n’obi ilu,
Mgbe ọ na-adịbeghị ihe dị mma o riri.+
26 Ha niile ga-edina n’ájá,+
Ikpuru ga-ekpuchikwa ha.+
27 Lee! Amaara m ihe unu na-eche,
Marakwa atụmatụ unu ga-eji meso m mmeso ọjọọ.+
28 N’ihi na unu na-asị, ‘Olee ụlọ onye ahụ a ma ama,
Oleekwa ụlọikwuu ndị ajọ omume, bụ́ ebe obibi ha?’+
29 Ọ̀ bụ na unu ajụbeghị ndị na-eme njem n’okporo ụzọ ase?
Ọ̀ bụ na unu adịghịkwa enyocha ihe akaebe ha nke ọma,
30 Na a na-ahapụ onye ọjọọ ndụ n’ụbọchị ọdachi,+
A na-anapụtakwa ya n’ụbọchị oké iwe?
31 Ònye ga-anọ n’ihu ya gwa ya ihe ọ na-eme?+
Ònyekwa ga-akwụ ya ụgwọ ihe o mere?+
32 Ọ bụ n’ili ka a ga-ebuba ya,+
A ga-echekwa ili nche.
33 Ọkpụrụkpụ ájá nke ndagwurugwu iyi ga-atọ ya ụtọ,+
Ọ ga-adọkpụrụkwa ihe niile a kpọrọ mmadụ ka ha so ya n’azụ,+
A pụghịkwa ịgụta ndị bu ya ụzọ ọnụ.
34 Leenụ nkasi obi na-enweghị isi unu na-enye m,+
Ihe niile unu na-aza m ka bụkwa ihe na-ezighị ezi!”