Levitikọs
20 Jehova gwakwara Mosis, sị: 2 “Gwa ndị Izrel, sị, ‘Ọ bụrụ na onye Izrel ọ bụla ma ọ bụ onye mbịarambịa ọ bụla nke bi n’Izrel enye Molek nwa ya ọ bụla,* a ga-egburịrị ya.+ Ndị obodo unu ga-eji nkume tụgbuo ya. 3 M ga-ajụ onye ahụ. M ga-egbukwa ya* maka na o nyere Molek nwa ya ma merụọ ebe nsọ m,+ mebiekwa aha nsọ m. 4 Ọ bụrụ na ndị obodo unu amara ụma leghara onye ahụ anya ma hapụ igbu ya mgbe o nyere Molek nwa ya,+ 5 m ga-ajụ onye ahụ na ezinụlọ ya.+ M ga-egbu onye ahụ,* gbuokwa ndị niile sooro ya kpawa àgwà ka ndị akwụna wee hapụ m fewe Molek.
6 “‘M ga-ajụ onye* hapụrụ m* gakwuru ndị na-agba afa+ na ndị na-akọ ihe ga-eme n’ọdịnihu.+ M ga-egbukwa ya.*+
7 “‘Unu ga-edo onwe unu nsọ ma dị nsọ,+ n’ihi na abụ m Jehova bụ́ Chineke unu. 8 Unu ga-edebe iwu m niile ma na-eme ha.+ Abụ m Jehova, onye na-edo unu nsọ.+
9 “‘Ọ bụrụ na e nwee onye kpọrọ nne ya ma ọ bụ nna ya iyi,* a ga-egburịrị ya.+ Ebe ọ bụ na ọ kpọrọ nne ya ma ọ bụ nna ya iyi, ọbara ya ga-adị ya n’isi.
10 “‘Ihe a bụ ihe a ga-eme ma nwoke na nwunye onye ọzọ kwaa iko: A ga-egburịrị onye ya na nwunye nwoke ibe ya kwara iko. A ga-egbu ma nwoke ahụ ma nwaanyị ahụ kwara iko.+ 11 Nwoke ya na nwunye nna ya nwere mmekọahụ* emenyela nna ya ihere.*+ A ga-egburịrị ha abụọ. Ọbara ha ga-adị ha n’isi. 12 Ọ bụrụ na nwoke na nwunye nwa ya enwee mmekọahụ,* a ga-egburịrị ha abụọ. Ha mere arụ. Ọbara ha ga-adị ha n’isi.+
13 “‘Ọ bụrụ na nwoke na nwoke ibe ya enwee mmekọahụ,* ha abụọ emeela arụ.+ A ga-egburịrị ha. Ọbara ha ga-adị ha n’isi.
14 “‘Ọ bụrụ na nwoke alụọ nwaanyị, ya na nne nwunye ya enweekwa mmekọahụ, ọ bụ omume rụrụ arụ.*+ A ga-egbu ya na ha ma kpọọ ha ọkụ,*+ ka omume rụrụ arụ ghara ịdịrị gawa n’ebe unu bi.
15 “‘Ọ bụrụ na nwoke na anụmanụ enwee mmekọahụ, a ga-egburịrị nwoke ahụ. Unu ga-egbukwa anụmanụ ahụ.+ 16 Ọ bụrụ na nwaanyị agakwuru anụmanụ ọ bụla ka ya na ya nwee mmekọahụ,+ unu ga-egbu nwaanyị ahụ na anụmanụ ahụ. A ga-egburịrị ha. Ọbara ha ga-adị ha n’isi.
17 “‘Ọ bụrụ na nwoke na nwanne ya nwaanyị, ya bụ, nwa nwaanyị nna ya mụrụ ma ọ bụ nwa nwaanyị nne ya mụrụ, enwee mmekọahụ wee hụ ọtọ ibe ha, ọ bụ ihe ihere.+ A ga-egbu ha n’ihu ndị Izrel. Nwoke ahụ emenyela nwanne ya nwaanyị ihere.* Ọ ga-aza ajụjụ maka mmehie ya.
18 “‘Ọ bụrụ na nwoke na nwaanyị nọ ná nsọ ya enwee mmekọahụ, ma nwoke ahụ ma nwaanyị ahụ ekpugheela ọbara na-agba nwaanyị ahụ.+ A ga-egbu ha abụọ.*
19 “‘Gị na nwanne nne gị nke nwaanyị na nwanne nna gị nke nwaanyị enwela mmekọahụ, n’ihi na ime otú ahụ bụ imenye onye gị na ya bụ otu ọbara ihere.+ Ndị mere ya ga-aza ajụjụ maka mmehie ha. 20 Nwoke ya na nwunye nwanne nna ya dinara emenyela nwanne nna ya ihere.*+ Ha ga-aza ajụjụ maka mmehie ha. Ha ga-anwụ n’amụtaghị nwa. 21 Ọ bụrụ na nwoke na nwunye nwanne ya enwee mmekọahụ, ọ bụ arụ.+ Nwoke ahụ emenyela nwanne ya nwoke ihere.* Ha agaghị amụta nwa.
22 “‘Debenụ iwu m niile, na-emekwanụ ihe niile m kpebiri,+ na-erubekwanụ isi na ha,+ ka a ghara ịchụpụ unu n’ala m na-akpọbata unu ka unu biri na ya.+ 23 Unu esokwala omenala nke mba ndị m na-achụpụrụ unu maka na ha mere ihe a niile,+ akpọkwara m ha asị.+ 24 Ọ bụ ya mere m ji sị unu: “Unu ga-eweghara ala ha. M ga-enyekwa ya unu ka ọ bụrụ nke unu, bụ́ ala mmiri ara ehi na mmanụ aṅụ na-eru na ya.*+ Abụ m Jehova bụ́ Chineke unu, onye mere ka unu dị iche ná ndị niile ọzọ.”+ 25 Unu ga-ama ihe dị iche n’anụ dị ọcha na anụ na-adịghị ọcha, marakwa ihe dị iche ná nnụnụ na-adịghị ọcha na nnụnụ dị ọcha.+ Unu ejikwala anụmanụ ma ọ bụ nnụnụ ma ọ bụ ihe ọ bụla na-arịgharị n’ala* merụọ onwe unu, ya bụ, anụ niile m gwara unu ka unu were ka anụ ndị na-adịghị ọcha.+ 26 Unu ga-abụrụ m ndị dị nsọ, n’ihi na mụnwa bụ́ Jehova dị nsọ.+ M na-emekwa ka unu dị iche ná ndị niile ọzọ, ka unu bụrụ ndị m.+
27 “‘Nwoke ma ọ bụ nwaanyị ọ bụla na-agba afa ma ọ bụ na-akọ ihe ga-eme n’ọdịnihu, a ga-egburịrị ya.+ Ndị obodo unu ga-eji nkume tụgbuo ya. Ọbara ya ga-adị ya n’isi.’”