Jenesis
6 Mgbe ndị mmadụ malitere ịdị ọtụtụ n’ụwa, ha amụọkwa ọtụtụ ụmụ nwaanyị, 2 ụmụ ezi Chineke*+ malitere ịhụ na ụmụ nwaanyị ndị mmadụ mụrụ mara mma. Ha wee na-alụrụ ụmụ nwaanyị ndị ha họọrọ. 3 Jehova wee sị: “Agaghị m* agbachi mmadụ nkịtị ruo mgbe ebighị ebi+ n’ihi na mmadụ bụ naanị anụ ahụ́.* N’ihi ya, ọ ga-adị ndụ otu narị afọ na iri abụọ (120).”+
4 Ndị Nefilim* nọ n’ụwa n’oge ahụ, ha nọkwa ruo oge ụfọdụ. Mgbe ahụ, ụmụ ezi Chineke na ụmụ nwaanyị ndị mmadụ mụrụ nwere mmekọahụ, ha wee mụọrọ ha ụmụ nwoke. Ọ bụ ha bụ ndị dike biri n’oge ochie, ụmụ nwoke a ma ama.
5 Jehova wee hụ na ihe ọjọọ mmadụ na-eme n’ụwa karịrị akarị nakwa na ihe mmadụ na-eche n’obi ya mgbe niile bụ naanị ihe ọjọọ.+ 6 O wutere Jehova na o kere mmadụ n’ụwa, obi adịghịkwa ya mma.+ 7 Jehova wee sị: “M ga-ekpochapụ ndị mmadụ m kere n’ụwa, ma mmadụ, ma anụ ụlọ, ma anụ ndị na-arị arị, ma anụ ndị na-efe efe, n’ihi na ọ na-ewute m na m kere ha.” 8 Ma ihe Noa masịrị Jehova.
9 Ihe a bụ akụkọ ndụ Noa.
Noa bụ onye ezi omume.+ O bighị ndụ ka ndị ya na ha dịkọrọ ndụ,* e nweghịkwa ihe a ga-eji taa ya ụta. Noa so ezi Chineke jee ije.+ 10 Ka oge na-aga, Noa mụrụ ụmụ nwoke atọ. Aha ha bụ Shem, Ham, na Jefet.+ 11 Ma n’anya ezi Chineke, ụwa emebiela, tigbuo zọgbuo jukwara na ya. 12 Chineke lere ụwa anya ma hụ na o mebiela.+ Mmadụ* niile na-eme ihe ọjọọ n’ụwa.+
13 Mgbe e mechara, Chineke sịrị Noa: “Ekpebiela m na m ga-ebibi mmadụ niile* maka na ndị juru n’ụwa bụ ndị tigbuo zọgbuo. N’ihi ya, m ga-ebibikọta ha na ụwa.+ 14 Jiri ezigbo osisi* rụọrọ onwe gị ụgbọ.+ Ị ga-arụnye nkebi dị iche iche n’ụgbọ ahụ ma jiri korota+ techie ime ya na azụ ya. 15 Otú a ka ị ga-esi arụ ya: Ụgbọ ahụ ga-adị narị kubit* atọ (300) n’ogologo, kubit iri ise n’obosara, na kubit iri atọ n’ịdị elu. 16 Ị ga-arụnye windo ebe ìhè ga-esi na-abata* n’ụgbọ ahụ. Malite n’elu ụgbọ ahụ ruo n’ebe ị ga-arụnye ya ga-adị otu kubit. Ị ga-arụnye ọnụ ụzọ ụgbọ ahụ n’akụkụ ya.+ Ị ga-arụ ụgbọ ahụ ka ọ dị okpukpu atọ, otu n’ala, otu n’etiti, otu n’elu.
17 “M ga-eme ka mmiri zoo tojuo+ n’ụwa. M ga-eji ya kpochapụ ihe niile na-eku ume n’ụwa.* Ihe ọ bụla dị n’ụwa ga-ala n’iyi.+ 18 Mụ na gị na-agba ndụ. Ị ga-abanye n’ụgbọ ahụ, gị na ụmụ gị na nwunye gị na ndị nwunye ụmụ gị.+ 19 Ị ga-achịbata ụdị anụmanụ ọ bụla dị ndụ+ abụọ abụọ n’ime ụgbọ ahụ ka e wee chebe ha ndụ. Ha ga-abụ oké na nne.+ 20 Anụ ndị ahụ ga-abịakwute gị abụọ abụọ n’ebe ahụ ka e wee chebe ha ndụ, ma anụ ufe n’ụdị ha dị iche iche, ma anụ ụlọ n’ụdị ha dị iche iche, ma anụ ndị ọzọ na-arị arị n’ụdị ha dị iche iche.+ 21 Ị ga-ewere ụdị ihe ọ bụla a na-eri eri+ ka ha bụrụ nri gị na anụmanụ ndị ahụ ga na-eri.”
22 Noa mere ihe niile Chineke nyere ya n’iwu. O mere nnọọ otú ahụ.+