Zekaraya
9 Ihe Chineke kpebiri ime:
“Jehova ekwuola ihe ọ ga-eme ala Hedrak.
Ọ bụ Damaskọs ka ọ ga-eme ya,+
N’ihi na anya Jehova na-ahụ ụmụ mmadụ+
Nakwa ebo niile e nwere n’Izrel.
3 Taya rụụrụ onwe ya mgbidi siri ike.
O kpokọtara ọlaọcha ka ájá,
Kpokọtakwa ọlaedo ka apịtị dị n’okporo ámá.+
4 Lee, Jehova ga-anapụ ya ihe ndị o nwere.
5 Ashkelọn ga-ahụ ya ma tụọ egwu.
Ọ ga-ewute Gaza nke ukwuu,
Wutekwa Ekrọn maka na e menyela ihe ọ tụkwasịrị obi ihere.
Eze Gaza ga-anwụ,
E nweghịkwa onye ga-ebi n’Ashkelọn.+
7 M ga-ewepụ ihe ndị dị ya n’ọnụ ọbara tetọrọ,
Wepụkwa ihe ndị na-asọ oyi dị ya n’ezé.
A ga-ahapụ ya ka ọ fọdụrụ Chineke anyị.
8 M ga-eguzoro n’ihu ụlọ m na-eche ya nche,+
Ka a ghara inwe onye ga-esi na ya na-apụ apụ ma ọ bụ na-abata abata.
Jeruselem,* tie mkpu mmeri.
Lee! Eze gị na-abịakwute gị.+
Ọ bụ onye ezi omume. Ọ na-eweta nzọpụta.*
10 M ga-ewepụ ụgbọ ịnyịnya agha n’Ifrem,
Wepụkwa ịnyịnya na Jeruselem.
A ga-ewepụ ụta agha.
Ọ ga-agwakwa mba dị iche iche na udo ga-adịrị ha.+
Ọchịchị ya ga-amalite n’oké osimiri ruo n’oké osimiri,
Malitekwa n’Osimiri Yufretis ruo n’ebe niile ụwa sọtụrụ.+
11 Ma gị, nwaanyị,* n’ihi ọbara ọgbụgba ndụ mụ na gị,
M ga-akpọpụta ndị gị a tụrụ mkpọrọ n’olulu nke mmiri na-adịghị.+
12 Unu ndị mkpọrọ ndị nwere olileanya, laghachinụ n’ebe a rụsiri ike.+
Taa, ana m asị gị,
‘Nwaanyị, m ga-akwụ gị ụgwọ okpukpu abụọ.+
M ga-eji Ifrem mere akụ́ ụta m.
Zayọn, m ga-akpọte ụmụ gị
Ka ha megide ụmụ Gris,
M ga-emekwa ka ị dị ka mma agha onye agha.’
14 Jehova ga-eme ka a mara na ya nọnyeere ha,
Akụ́ ọ ga-agba ga-apụ ngwa ngwa ka àmụ̀mà.
Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova ga-afụ opi,+
Ọ ga-esorokwa ifufe nke si n’ebe ndịda gawa.
15 Jehova nke ụsụụ ndị agha ga-echebe ha.
Ha ga-emeri ndị iro ha ndị ji èbè* na-agba ha nkume.+
Ha ga-aṅụrị ọṅụ ma na-eti mkpu ka à ga-asị na ha ṅụrụ mmanya.
Ha ga-adị ka efere mmanya juru,
Dịkwa ka akụkụ ebe ịchụàjà nke ọbara juru na ya.+