Malakaị
2 “Ndị nchụàjà, ọ bụ unu ka m na-enye iwu a.+ 2 Ọ bụrụ na unu egeghị ntị, ọ bụrụkwa na e nweghị ihe unu ji ito aha m kpọrọ,* m ga-abụ unu ọnụ,+ m ga-emekwa ka ngọzi unu bụrụ ịbụ ọnụ.+ N’eziokwu, emeela m ka ngọzi unu bụrụ ịbụ ọnụ n’ihi na e nweghị ihe unu ji ya kpọrọ.” Ọ bụ ihe Jehova nke ụsụụ ndị agha kwuru.
3 “Lee, m ga-emebi mkpụrụ unu kụrụ akụ* n’ihi unu,+ m ga-efekwa unu nsị n’ihu, nsị anụmanụ unu ji chụọ àjà n’oge ememme unu. A ga-eburukwa unu tụba na ya.* 4 Unu ga-amatazi na m nyere unu iwu a ka ọgbụgba ndụ mụ na Livaị wee dịgide.”+ Ọ bụ ihe Jehova nke ụsụụ ndị agha kwuru.
5 “Ọgbụgba ndụ mụ na ya bụ nke ndụ na nke udo, nke m nyere ya, ka o wee tụọ egwu m.* Ọ tụrụ egwu m. N’eziokwu, ọ tụrụ egwu aha m. 6 Iwu* nke eziokwu dị n’ọnụ ya,+ e nweghịkwa okwu ọjọọ a hụrụ n’egbugbere ọnụ ya. Mụ na ya dị n’udo. Ọ kwụwara aka ya ọtọ,+ meekwa ka ọtụtụ ndị hapụ mmehie ha. 7 N’ihi na egbugbere ọnụ onye nchụàjà kwesịrị ịna-akụziri ndị mmadụ gbasara Chineke, ndị mmadụ kwesịkwara ịna-ajụta ya ihe iwu kwuru*+ maka na ọ bụ onye ozi Jehova nke ụsụụ ndị agha.
8 Jehova nke ụsụụ ndị agha kwuru, sị, “Ma unu ahapụla ụzọ ahụ. Unu emeela ka ọtụtụ ndị ghara ịna-edebe iwu.*+ Unu emebiela ọgbụgba ndụ Livaị.+ 9 N’ihi ya, m ga-eme ka ndị niile kpọọ unu asị ma leda unu anya n’ihi na unu esoghị ụzọ m, kama unu na-ele mmadụ anya n’ihu ma unu mewe ihe iwu kwuru.”+
10 “Ọ́ bụghị otu nna ka anyị niile nwere?+ Ọ́ bụghị otu Chineke kere anyị? Gịnịzi mere anyị ji na-aghọ ibe anyị aghụghọ,+ na-emebi ọgbụgba ndụ ndị nna nna anyị? 11 Juda aghọọla aghụghọ, e meekwala arụ n’Izrel nakwa na Jeruselem; n’ihi na Juda asọpụrụghị* Jehova+ onye hụrụ ihe dị nsọ n’anya. Juda lụkwara nwaanyị na-efe chi ndị mba ọzọ.*+ 12 Jehova ga-ebibi onye ọ bụla na-eme ihe a n’ụlọikwuu Jekọb, onye ọ sọkwara ya bụrụ,* n’agbanyeghị na ọ na-ewetara Jehova nke ụsụụ ndị agha onyinye.”+
13 “E nwekwara ihe ọzọ* unu na-eme nke mere ka anya mmiri, ibe ákwá, na ịsụ ude kpuchie ebe ịchụàjà Jehova, nke mere na ọ naghịzi anabata onyinye unu, ihe ọ bụla unu wetara anaghịkwa amasị ya.+ 14 Unu na-asịkwa, ‘Ọ̀ bụ n’ihi gịnị?’ Ọ bụ n’ihi na Jehova agbaala akaebe na ị ghọrọ nwunye ị lụrụ n’okorobịa aghụghọ, n’agbanyeghị na ọ bụ nwunye gị, bụrụkwa nwaanyị gị na ya gbara ndụ.+ 15 Ma, e nwere onye na-emeghị otú ahụ n’ihi na mmụọ nsọ ka dị n’ime ya. Gịnịkwa ka onye ahụ na-achọ? Ọ na-achọ ụmụ* ga-abụ nke Chineke. N’ihi ya, kpacharanụ anya gbasara ihe unu na-eche n’obi unu,* ka onye ọ bụla ghara ịghọ nwunye ọ lụrụ n’okorobịa aghụghọ. 16 N’ihi na m kpọrọ* ịgba alụkwaghịm asị.”+ Ọ bụ ihe Jehova bụ́ Chineke Izrel kwuru. “M kpọkwara onye na-arụ arụrụala* asị. Kpacharanụ anya gbasara ihe unu na-eche n’obi unu,* unu aghọkwala aghụghọ.”+ Ọ bụ ihe Jehova nke ụsụụ ndị agha kwuru.
17 “Ihe unu na-ekwu emeela ka ike unu gwụ Jehova.+ Ma, unu na-asị, ‘Olee otú anyị si mee ka ike anyị gwụ ya?’ Ọ bụ maka na unu na-asị, ‘Onye ọ bụla na-eme ihe ọjọọ dị mma n’anya Jehova, ihe onye ahụ na-amasịkwa ya,’+ ma ọ bụ na-asị, ‘Ebee ka Chineke onye na-ekpe ikpe ziri ezi nọ?’”