Abụ Ọma
Gbasara Solomọn.
2 Ka o kpee ikpe ziri ezi mgbe ọ na-ekpechite ọnụ ndị gị,
Ka o kpeekwa ikpe ziri ezi mgbe ọ na-ekpechite ọnụ ndị ọ na-enweghị ka ọ hà ha.+
3 Ka ugwu ukwu mee ka udo dịrị ndị mmadụ,
Ka ugwu nta meekwa ka ha na-eme ezi omume.
4 Ka o kpechite ọnụ ndị ọ na-enweghị ka ọ hà ha* n’ime ndị gị.
Ka ọ zọpụta ụmụ ndị ogbenye,
Ka o bibiekwa onye na-erigbu ndị ọzọ.+
5 Ha ga na-atụ egwu gị ogologo oge niile anyanwụ dị
Nakwa ogologo oge niile ọnwa dị,
Si n’ọgbọ ruo n’ọgbọ.+
7 N’oge ọchịchị ya, ihe ga na-agaziri onye ezi omume,+
Udo ga-adịkwa ebe niile+ ruo mgbe ọnwa na-agaghịzi adị.
8 Ọ ga-enwe ndị ọ na-achị* malite n’oké osimiri ruo n’oké osimiri,
Malitekwa n’Osimiri Yufretis ruo n’ebe niile ụwa sọtụrụ.+
10 Ndị eze Tashish na ndị eze agwaetiti dị iche iche ga-atụrụ ya ụtụ.+
Ndị eze Shiba na ndị eze Siba ga-eweta onyinye.+
11 Ndị eze niile ga-akpọrọ ya isiala,
Mba niile ga-ejekwara ya ozi.
12 N’ihi na ọ ga-anapụta ogbenye nke na-ebe ákwá ka e nyere ya aka,
Napụtakwa onye ọ na-enweghị ka ọ hà ya na onye ọ bụla na-enweghị onye na-enyere ya aka.
13 Ọ ga-emere ogbenye na onye ọ na-enweghị ka ọ hà ya ebere,
Ọ ga-azọpụtakwa ndị ogbenye.
14 Ọ ga-anapụta ha* n’aka ndị na-emegbu ha nakwa n’aka ndị na-emesi ha ike,
Ọ ga-ejikwa ndụ* ha kpọrọ ihe.
15 Ka ọ dịrị ndụ, ka e nyekwa ya ọlaedo Shiba.+
Ka a na-ekpere ya ekpere mgbe niile,
Ka a na-agọzikwa ya mgbe niile.
Ọ ga-eju eju n’elu ugwu dị iche iche.
Mkpụrụ a kụrụ n’ubi ya ga na-eme nke ọma ka osisi ndị dị na Lebanọn,+
Ndị nọ n’obodo ya dị iche iche ga na-amakwa pokopoko ka ihe a kụrụ n’ala.+
17 Ka aha ya dịruo mgbe ebighị ebi.+
Ka aha ya na-ede ude ogologo oge niile anyanwụ dị.
Ka e si n’aka ya gọzie ndị mmadụ.+
Ka mba niile kpọọ ya onye obi ụtọ.
Amen na Amen.