Akwụkwọ Ozi E Degaara Ndị Hibru
8 Isi ihe anyị na-ekwu bụ na anyị nwere ụdị nnukwu onye nchụàjà a.+ Ọ nọdụkwala ala n’aka nri ocheeze Onye Ukwu ahụ n’eluigwe.+ 2 Ọ na-eje ozi* n’ebe nsọ*+ nakwa n’ezigbo ụlọikwuu nke Jehova* rụrụ, ọ bụghị mmadụ. 3 N’ihi na a na-ahọpụta nnukwu onye nchụàjà ọ bụla ka ọ na-enye Chineke onyinye dị iche iche e wetaara ya nakwa ka ọ na-achụrụ Chineke àjà. Ọ bụ ya mere onye a ji kwesịkwa inwe ihe ọ ga-achụ n’àjà.+ 4 A sị na ọ nọ n’ụwa, ọ garaghị abụ onye nchụàjà,+ ebe ọ bụ na e nweela ndị nchụàjà ndị na-enye Chineke onyinye dị iche iche e wetaara ya otú Iwu* kwuru. 5 Ozi dị nsọ ha na-eje bụ ihe atụ, ọ nọchikwara anya+ ihe ndị dị n’eluigwe.+ Ihe gosiri nke a bụ ihe Chineke nyere Mosis n’iwu mgbe ọ chọrọ ịrụ ụlọikwuu ahụ. Chineke sịrị ya: “Hụ na ị rụrụ ihe niile ka ha dị ka ihe ndị e gosiri gị n’ugwu.”+ 6 Ma ugbu a, e nyela Jizọs ozi ka nnọọ mma* n’ihi na ọ bụkwa onye ogbugbo+ nke ọgbụgba ndụ ka mma.+ Iwu Chineke kwadoro ọgbụgba ndụ a, o hiwekwara isi ná nkwa ndị ka mma.+
7 A sị na e nweghị ihe dị njọ n’ọgbụgba ndụ nke mbụ, a garaghị ekwuwe okwu ọgbụgba ndụ nke abụọ.+ 8 N’ihi na ọ hụrụ na ndị Izrel na-eme ihe na-adịghị mma. Ọ bụ ya mere o ji sị: “Jehova* kwuru, sị, ‘Oge na-abịa mgbe mụ na ndị Izrel na ndị Juda ga-agba ọgbụgba ndụ ọhụrụ. 9 Ọ gaghị adị ka ọgbụgba ndụ ahụ mụ na ndị nna nna ha gbara n’ụbọchị m seere ha n’aka si n’Ijipt kpọpụta ha+ n’ihi na ha hapụrụ ọgbụgba ndụ m, m wee kwụsị ilekọta ha.’ Ọ bụ ihe Jehova* kwuru.
10 “Jehova* kwukwara, sị: ‘Ọgbụgba ndụ mụ na ndị Izrel ga-agba mgbe oge ahụ gachara bụ na m ga-etinye iwu m n’uche ha, m ga-edekwa ya n’obi ha.+ M ga-abụ Chineke ha, ha ga-abụkwa ndị m.’+
11 “‘A gaghịzi enwe onye ga-akụziri nwa amaala ibe ya na nwanne ya, sị: “Mara Jehova.”* N’ihi na ha niile ga-ama m, malite n’onye kacha nta n’ime ha ruo n’onye kacha ukwuu. 12 N’ihi na m ga-agbaghara ha ajọ omume ha, agaghịzi m echeta mmehie ha.’”+
13 Mgbe ọ sịrị “ọgbụgba ndụ ọhụrụ,” o meela ka nke mbụ bụrụ nke ochie.+ Ọ fọrọ obere ka ihe ahụ mere ochie, nke oge ya na-agafekwa, gharazie ịdị.+