20 Ma ihe ọ bụla nke chọrọ amamihe na nghọta+ nke eze jụrụ ha ajụjụ banyere ya, ọ chọpụtara na ha maara ya ọbụna okpukpu iri karịa ndị dibịa anwansi+ niile na ndị na-akpọku ndị mmụọ ọjọọ,+ bụ́ ndị nọ n’ebe niile ọ na-achị.
9 Ma n’obodo ahụ, e nwere otu nwoke aha ya bụ Saịmọn, bụ́ onye nọ na-eme anwansi+ tupu oge a, na-emekwa ihe na-eju obodo Sameria anya, na-ekwu na ya onwe ya bụ nnukwu mmadụ.+
8 Ọ bụ otú ahụ Janis na Jambris+ si guzogide Mozis ka ndị a sikwa na-eguzogide eziokwu.+ Ha bụ ndị uche ha rụrụ arụ kpamkpam,+ ndị a jụrụ ajụ n’ihe banyere okwukwe Ndị Kraịst.+