8 O wee ruo n’ụtụtụ na mmụọ ya ezughị ike.+ O wee zie ozi kpọọ ndị niile na-eme anwansi n’Ijipt+ na ndị amamihe ya niile,+ Fero wee kọọrọ ha nrọ ya.+ Ma e nweghị onye kọwaara Fero nrọ ndị ahụ.
11 Ndị isi Zoan+ dị nnọọ nzuzu. Ndụmọdụ nke ndị maara ihe n’etiti ndị ndụmọdụ Fero bụ ihe ezi uche na-adịghị na ya.+ Olee otú unu ga-esi asị Fero: “Abụ m nwa ndị maara ihe, nwa ndị eze oge ochie”?
2 Eze wee kwuo ka a kpọọ ndị dibịa anwansi+ na ndị na-akpọku ndị mmụọ ọjọọ na ndị dibịa afa na ndị Kaldia ka ha bịa kọọrọ eze nrọ ọ rọrọ.+ Ha wee bata guzo n’ihu eze.
8 Ọ bụ otú ahụ Janis na Jambris+ si guzogide Mozis ka ndị a sikwa na-eguzogide eziokwu.+ Ha bụ ndị uche ha rụrụ arụ kpamkpam,+ ndị a jụrụ ajụ n’ihe banyere okwukwe Ndị Kraịst.+
8 Ma ndị ụjọ na ndị na-enweghị okwukwe+ na ndị rụrụ arụ n’ihi omume ha ruru unyi+ na ndị na-egbu ọchụ+ na ndị na-akwa iko+ na ndị na-eme mgbaasị na ndị na-ekpere arụsị+ na ndị ụgha niile,+ òkè ha ga-abụ n’ime ọdọ ahụ nke ji ọkụ+ na sọlfọ+ na-enwu. Nke a pụtara ọnwụ nke abụọ.”+