Ọpụpụ 9:14 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 14 N’ihi na n’oge a, m ga-eme ka ihe otiti m niile bịakwasị gị na ndị na-ejere gị ozi na ndị gị, ka i wee mara na ọ dịghị onye dị ka m n’ụwa dum.+ Ọpụpụ 15:11 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 11 Jehova, ònye n’ime chi niile dị ka gị?+Ònye dị ka gị, gị onye dị nsọ nke ukwuu?+Onye a ga-eji abụ otuto+ tụọ egwu ya,+ Onye na-eme ihe dị ịtụnanya.+ 2 Samuel 7:22 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 22 Ọ bụ ya mere i ji dị ukwuu n’ezie,+ Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova; n’ihi na ọ dịghị onye ọzọ dị ka gị,+ ọ dịghịkwa Chineke dịnụ ma e wezụga gị+ n’ime chi niile anyị jiworo ntị anyị nụ. Abụ Ọma 83:18 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 18 Ka ndị mmadụ wee mara+ na gị onwe gị, onye aha gị bụ Jehova,+Ọ bụ naanị gị bụ Onye Kasị Elu+ n’ụwa niile.+ Abụ Ọma 86:8 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 8 Ọ dịghị onye dị ka gị n’etiti chi niile, Jehova,+Ọ dịghịkwa ọrụ yiri ọrụ gị.+ Aịzaya 46:9 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 9 Chetanụ ihe mbụ ndị mere n’oge dị anya gara aga,+ na abụ m Chineke,+ ọ dịghị Chineke ọzọ dịnụ,+ ọ dịghịkwa onye dị ka m;+ Jeremaya 10:6 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 6 Jehova, o nwetụdịghị onye dị ka gị.+ Ị dị ukwuu, aha gị dị ukwuu, dịkwa ike.+ Ndị Rom 9:17 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 17 N’ihi na Akwụkwọ Nsọ gwara Fero, sị: “N’ihi nke a ka m ji hapụ gị ndụ, ka m wee jiri gị gosi ike m, ka e wee kpọsaakwa aha m n’ụwa dum.”+
14 N’ihi na n’oge a, m ga-eme ka ihe otiti m niile bịakwasị gị na ndị na-ejere gị ozi na ndị gị, ka i wee mara na ọ dịghị onye dị ka m n’ụwa dum.+
11 Jehova, ònye n’ime chi niile dị ka gị?+Ònye dị ka gị, gị onye dị nsọ nke ukwuu?+Onye a ga-eji abụ otuto+ tụọ egwu ya,+ Onye na-eme ihe dị ịtụnanya.+
22 Ọ bụ ya mere i ji dị ukwuu n’ezie,+ Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova; n’ihi na ọ dịghị onye ọzọ dị ka gị,+ ọ dịghịkwa Chineke dịnụ ma e wezụga gị+ n’ime chi niile anyị jiworo ntị anyị nụ.
18 Ka ndị mmadụ wee mara+ na gị onwe gị, onye aha gị bụ Jehova,+Ọ bụ naanị gị bụ Onye Kasị Elu+ n’ụwa niile.+
9 Chetanụ ihe mbụ ndị mere n’oge dị anya gara aga,+ na abụ m Chineke,+ ọ dịghị Chineke ọzọ dịnụ,+ ọ dịghịkwa onye dị ka m;+
17 N’ihi na Akwụkwọ Nsọ gwara Fero, sị: “N’ihi nke a ka m ji hapụ gị ndụ, ka m wee jiri gị gosi ike m, ka e wee kpọsaakwa aha m n’ụwa dum.”+