8 “Were mkpara gị,+ kpọkọta nzukọ a, gị na Erọn nwanne gị, gwanụ nkume ahụ dị elu okwu n’ihu ha ka ọ gbapụta mmiri; mee ka mmiri si na nkume ahụ dị elu gbapụtara ha, nyekwa nzukọ a na anụ na-eburu ha ibu mmiri ka ha ṅụọ.”+
15 onye mere ka i jiri ụkwụ gafee nnukwu ala ịkpa nke dị egwu,+ ebe e nwere agwọ ọjọọ+ nakwa akpị, ebe bụkwa ala kpọrọ nkụ nke mmiri na-adịghị; onye mere ka mmiri si n’oké nkume siri ike gbapụtara gị;+
15 I nyekwara ha achịcha nke si n’eluigwe n’ihi agụụ nke na-agụ ha,+ i mekwara ka mmiri si na nkume dị elu gbapụtara ha n’ihi akpịrị nke na-akpọ ha nkụ,+ i wee gwa ha ka ha banye+ ma nweta ala ahụ i weliri aka gị ṅụọ iyi na ị ga-enye ha.+
21 Akpịrị akpọghị ha nkụ+ mgbe o mere ka ha jee ije ọbụna n’ebe tọgbọrọ n’efu.+ O mere ka mmiri si n’oké nkume gbapụtara ha, o wee gbawaa oké nkume ka mmiri wee gbapụta.”+