21 Ahitofel wee sị Absalọm: “Dinaa ndị iko nna gị,+ bụ́ ndị ọ hapụrụ ka ha lekọtawa ụlọ.+ Izrel dum ga-anụkwa na i mewo onwe gị ka ị na-esi ísì ọjọọ+ n’ebe nna gị nọ,+ aka+ ndị niile dịnyeere gị ga-adịkwa ike.”
22 Eze Sọlọmọn wee zaa nne ya, sị: “Gịnị medịrị i ji arịọ ka a kpọnye Adọnaịja Abishag nwaanyị Shunem? Rịọkwuonụ ka e nye ya ọchịchị+ a (maka na ọ bụ nwanne m nke tọrọ m),+ ọbụna ya onwe ya, nyekwa ya Abayata+ onye nchụàjà nakwa Joab+ nwa Zeruya.”+