14 Ha wee lie ọkpụkpụ Sọl na ọkpụkpụ Jọnatan nwa ya n’ala Benjamin, na Zila,+ n’ebe e liri Kish+ nna ya, ka ha wee mee ihe niile eze nyere n’iwu. Chineke wee nabata arịrịọ ha maka ala ahụ mgbe e mesịrị ihe a.+
13 O wee na-ekpeku ya ekpere, nke mere na ọ nabatara+ arịrịọ ya. O wee nụ arịrịọ ọ na-arịọ ka e meere ya amara. O wee mee ka ọ lọghachi Jeruselem, n’ọchịchị ya;+ Manase wee mara na Jehova bụ ezi Chineke.+