23 O wee malite ịchụrụ chi dị iche iche+ nke Damaskọs,+ bụ́ ndị na-awakpo ya, àjà, o wee sị: “Ebe ọ bụ na chi ndị eze Siria na-enyere ha aka,+ m ga-achụrụ ha àjà, ka ha wee nyere m aka.”+ Ha wee ghọọrọ ya na Izrel dum ihe ịsụ ngọngọ.+
21 “Gaanụ jụọ Jehova ase+ n’aha m+ nakwa n’aha ihe fọdụrụ n’Izrel nakwa na Juda banyere ihe e kwuru n’akwụkwọ a+ a hụrụ, n’ihi na ọnụma Jehova+ nke ọ ga-awụkwasị anyị dị ukwuu n’ihi na nna nna anyị hà emeghị ihe Jehova kwuru, ha emeghị ihe niile e dere n’akwụkwọ a.”+
12 Otú ọ dị, ebe ọ bụ na ndị nna anyị kpasuru Chineke nke eluigwe iwe,+ o nyefere+ ha n’aka Nebukadneza+ eze Babịlọn, onye Kaldia,+ ọ kwadakwara ụlọ a+ wee dọrọ ndị anyị n’agha laa Babịlọn.+